Leicester City vs Arsenal: Aṅụọla Arsenal ka 'akpụrụ achịa'

Ebe foto si, Getty Images
Ohere Arsenal nwere iji soro n'asọmpị "Champions League" nke "season" ọzọ nọzị n'elu ka Leicester City ji ha mee nrị ehihe ka ha zutere na "Premier League".
Ya bu ọdachi bịakwụtere ha n'ọgbọ egwuregwu King Power Stadium nke Leicester City.
Agbanyeghị na njem Champions League nọ n'elụ akwa, Arsenal ahụghị ụkwụ ha jị agba bọolụ ka Leicester jị ọkpụ goolu atọ asataghị otu mee ha akaja.
Agbanyeghị na-ewepụrụ otu onye Arsenal bụ Ainsley Maitland-Niles akwụkwọ ọbara ọbara.
Nke bụ ugboro atọ n'otu ahịrị apịaturu Arsenal na Premier League.
Ugbua, ha na-achụ Chelsea n'azụ bụ ndị ga-ezute Manchester United taa.





