Arsenal vs Rennes: Arsenal anapụtala Rennes isi ha

Ebe foto si, Getty Images
Goolu abụọ Pierre-Emerick Aubameyang nyere na nkeji ise na nkeji 72, na nke Ainsley Maitland-Niles nyere na nkeji 15, zuru ịkpọ ntu n'akpati e ji lie olileanya Rennes.
Aubameyang ghọrọ agụ n'ọgbọegwuregwu, were bọọlụ gbakasịa ndị Rennes ahụ.
Ka o nyere goolu nke abụọ ya, Aubameyang fụrụ ekpo "black panther" ọ tọgbọrọ n'azụ poostu, mere ka ogbubọọlụ nye ya akwụkwọ mme mme nke ịdọ aka na ntị. (
Cheta na Rennes mere Arsenal echeta ebewe ka ha ji goolu atọ merie ha mgbe ha zutere na Roazhon Park n'izu gara aga.

Ebe foto si, Getty Images
Mana Arsenal mere ha "ị gaghị akparị mmadụ n'ụlọ ya" ka ha enyeghi ha ohere ikuru ume ndụ n'ọgbọegwuregwu Emirates.

Ebe foto si, Bryn Lennon
Mmeri a Arsenal ji mkpokọta (4 - 3) merie, enyela ha ikike ibanye n'agba anọ-ikpeazụ.
Chetakwa na asọmpi Europa League a bụ ihe Unai Emery bụ onye nchịkota otu Arsenal ji eri; o buliri iko a ugboro atọ oge ọ na-achịkọta otu Sevilla.
Ọ ga-ebulatanwu iko a n'Arsenal, ka a ga-agbaji ya aka.









