'Anyị dị ndụ taa bụ enyemaka ndị mmadụ' - Ifebuchechukwu Eze Onyeisi

Nwaanyị boro di ya ebubo ịgbu nwa ha nwoke bụ Chimdalu Onyeisi ezigarala ndị mmadụ gbataara ọsọ enyemaka ozi ekele.
Nwaanyị a aha ya bụbu Ifebuchechukwu Eze Onyeisi, mana ọ na-azazị Ifebuche Eze, gbanwere aha ya dịka ya bụ ihe mechara.
Etu ndụ ya siri gbanwee
Ifebuche Eze kwuru na kamgbe BBC Igbo bịara gbaa ya ajụjụ ọnụ na ndụ ya agbanweela nke ọma.
O kelekwara Gọvanọ Enugwu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi, nakwa otu nwoke aha ya bụ Pat Asado maka nnukwu ọgọ ha meere ya.
Ifebuche Eze kwuru na ya ebidobeghị ahịa kama na ụmụ ya na-eri nrị ugbua site n'enyemaka ndị mmadụ.

Ebee ka di Ifebuchi nọ ugbua?
Ifebuche Eze kwuru di ya nọ na mkpọrọ n'ụlọọrụ ndị uweojii, mana ọ gabeghị ga hụ ya.
O kwuru na ọ bụ di ya ji ọnụ ya saa asịsa na ọ bụ ya gburu nwa ha, dịka ha chọrọla ya abalị atọ.
"Enweghị onye boro di m ebubo ịgbu nwa ya, ọ bụ ya ji ọnụ ya kwuo na ọ bụ ya gburu nwa ya a na-achọ achọ kamgbe abalị atọ," Ifebuchi kwuru.
"Ọ bụ ekpere ndị mmadụ na-ekpe mere o ji kwuo eziokwu".
Ifebuche kwukwara na ndị mmadụ sooro di ya gaa n'akụkụ osimiri dị na Trans-Ekulu, n'Enugwu, ebe ọ sị na ọ nọ gbuo nwa ha aha ya bụ Chimdalu.
"Di m nọ na nga ugbua, agabeghị m ga hụ ya. Ndị uweojii akpọbeghị m maọbụ kọọrọ m ihe merenụ kpọmkwem".
Ifebuche sị na o kwenyere na aka ga-akpara ndị niile aka ha dị n'ọnwụ nwa ya.
Mgbe a jụrụ ya ma ọ gbaharala di ya, o kwuru sị, "Ọ di n'aka Chukwu".
Mgbe Gọv Ugwuanyị agbatara nwaanyị a ọsọ enyemaka

Ebe foto si, Enugu Government
Oge akụkọ a pụtara ọhụrụ n'ọnwa Nọvemba afọ 2021, Gọvanọ Enugwu steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyi gara leta nwaanyị a bụ Ifebuchechukwu Eze na ụmụ ya iji kasie ha obi.
Ugwuanyi kwere ha nkwa enyemaka pụrụ iche, ma kwukwaa na ọ gaghị agbachi nkịtị ka ha taa ahụhụ.
Onye ndụmọdụ pụrụ iche gọvanọ Ugwuanyi n' okwu mgbasaozi bụ Steve Oruruo bụ onye kwupụtara nke a oge ọ gara leta nwaanyị na ụmụ ya ụbọchị Fraide.
O kwuru, "Anyị na-ekwe gị nkwa na gọọmentị ga-akwụ gị n'azụ ịhụ na e belata ahụhụ na obimgbawa site n'ihe mere gị."
"Ebumnobi gọọmentị bụ iso ụzọ iwu iji hụ na e mere nnyocha zuru oke nakwa ikpe ziri ezi."
Nsogbu biakwutere m karịrịrị m- Ifebuchi Eze

Ndị uweojii Enugwu nwụchiri Chidi Onyeisi gbara afọ iri atọ na isii na n'otu 'ụkọchukwu' maka ebubo na o gburu nwa ya nwoke maka ọgwụ ego.
N'oge ahụ, Ifebuche Eze, onye Nsuka, gwara BBC Igbo na "nsogbu biakwutere m karịrịrị m".
O kwuru na ya bụ nwa ya nwoke e gburu bụ nke atọ n'ime ụmụ isii ya na di ya mụrụ.

Oriakụ Onyeisi kọwara na ụbọchị nwa ya nwoke furu, na ya kpọrọ di ya n'ekwentị ịgwa ya ihe mere ihe karịrị ugboro iri abụọ mana ọ zaghị ekwentị ya.
Mana o mechara kpọchigha ya, ya gwa ya ihe mere, di ya kwuo na ọ maghị ebe nwa ya nọ, na gbanyeghị na nwa ya gwara ya na nna ha lọghachiri azụ n'ụlọ ha ka ọ pụchara.
O kwuru na ọtụtụ ndị agbataobi nyere aka ịchọ nwa ya, ebe di ya egosighị uchu na mgbọ ahụ.
"Ọ bụ ka ndị Block Rosary sịrị na anyị ga-eme ekpere Novena abalị 21 nke ọ pụtara ihe."
"N'abalị nke 14 a malitere ekpoere ka ọ pụtara ihe."

O kwuru na ndị mmadụ na-agwa ya na aka ya di ya ga-adị n'ofufu nwa ya n'ihi netu o si ghara iso agba mbọ maka nchọta ya.
O kwuru na di ya na-anya Keke "na-arụrụ otu nwoke bụ Ụkọchukwu Oluba Olumba ọrụ."
Okwu a ka dị n'aka ndị uweojii

Ebe foto si, Enugu state Police
Ndị uweojii n'Enugwu steeti kwuru na ha anwụchiela otu nwoke ahụ gbara afọ iri atọ na isii maka ebubo na o gburu nwa ya nwoke dị afọ asaa.
Nwoke ahụ gbaara ndị uweojii ama na o nwere onye ụkọchukwu kpuru isi bi na Trans-Ekulu nyeere ya aka n'mmehie ahụ.
Tupu a nwụchie ya, ọ gara na nke ndị uweojii mee mkpesa n'ụbọchị 22 nke ọnwa Ọktoba dịka o gbuchara n'otu ụbọchị ahụ.
Ọ mechara kpọrọ ndị uweojii gaa n'ikpere mmiri dị na Abakpa Nike ebe egwuputara ọzụ nwata ahụ.
Kọmịshọna ndị uweojii na steeti ahụ enyela iwu ka amalite ezi nnyocha banyere ihe ahụ mere.
Ọ dụkwara ndị Enugwu ndụmọdụ ha hie asaa n'anya n'ihe gbasara nchekwa ma kpaa n'aka ndị uweojii ma o nwee onye ha jidere na-eme mpụ.











