Ritual Killings: Ihe mere ndị ntorobia obodo Ọkata dị n'Imo steeti ji nye eze obodo ha ọsọ

Ndị ntorobia obodo Ọkata dị n' Ihitte/Uboma nke Imo Steeti, enyela eze ọdịnala ha bụ Eze Christian Iwueke ọsọ dịka ha mere ngagharịiwe maka oke ogbugbu mmadụ na-eme n'obodo ha.
Ndị ntorobia ruru 200 ndị mere ngagharịiwe na nso nso a na-ebo eze ha ebubo aka ya dị n'ogbugbu e gbuorola ọtụtụ ndị mmadụ bụ ndị ha na-eche ndị ọgwụ ego nke ha kwuru na-enye obodo ahụ ajọ aha.
Ha kwere Eze Iwueke nkwa na ha ga-egosi ya ihe ọkụ ji ntị oke eme ma ọ bụrụ n'aka ha kpara ya.

Ebe foto si, Oguego
Dịka onyeisioche nke ogbe Umuokoro Uhuala bụ John Anyanwu si gwa onye ntaakụkọ anyị, "Ọ gbara anyị gharịị oge anyị tetara n'abalị asatọ gara aga were nụ mkpu otu n'ime nwa anyị oge nwa eze nwoke na mmadụ abụọ ndị otu nzuzo o siri Owere kpọta na-abọkasị ya.
"Anyị chụwara ha ọsọ, nwude mmadụ abụọ mana nwa eze na ndị ọzọ gbalagara."
Onyeisi ndị uweojii n'ogige ndị uweojii Ihitte/Uboma bụ Charles Njoku bụ onye gbatara ọsọ oge ihe na-eme ma gbochie ndị ntorobia igbu eze ahụ ma gbaa ụlọ ya ọkụ.
Njoku rịọrọ ka ha ghara iji aka ha ekpe ma bie ikpe.
Mark Uchendu, onye bụbu odeakwụkwọ gọọmenti Imo steeti bụ onye ya na onyeisi ndị uweojii na mpaghara so gaa ije ahụ rịọ ndị obodo ha ka iwe ha dajụọ ganye na ndị uweojii emechaa nnyocha.
Ndị ntorobia ji iwe kụọ mmadụ abụọ ahụ ma kpọọ oku ka eze kpụta nwa ya nwoke maka eze jụụ ịkpọpụta nwa ya ka e kpee ya ikpe."
Onye ntorobia achọghị ka akpọ aha ya kwukwra sị, "E gbuola ọtụtụ ndị mmadụ n'obodo anyị mana o nweghị ihe eze anyị mere maka ya . Nke a gosiri na ọ ma ihe na-eme."
Ọ kpọrọ oku ka ndị uweojii nyochaa ebe mmiri si banye opi ụgbọgụrụ ma taa ndị aka ha dị n'oke ogbugbu mmadụ na-eme n'obodo ha.
Mbọ BBC gbara ịnụta olu Eze na-ebubo n e boro ya amịtaghị mkpụrụ dịka ọnọghị na obi ya.
A kpọrọ ya n'ekwentị ugboro ugboro mana ekwenti ya agaghị.













