Anambra state: Aka Willie Obiano adịghị n'ịhọpụta Eze ọhụrụ Aguleri

Ebe foto si, James Eze
Ọnụ na-ekwuchitere Willi Obiano bụ James Eze gwara BBC Igbo na aka Gọvanọ adịghị na nhọpụta Eze Aguleri ọhụrụ
O kwuru na ọ bụ iwu ala nyere ikike ịnye onye ọbụla a họpụtara asambodo njirimara ya.
Eze kwukwara na obi dị ndị Aguleri mma n'ebe eze ọhụrụ ha nọ ma kwuo na esemokwu gbasara ocheze bụ n'ime ezinaụlọ Idigo ka o jedebere.
Gịnị na-ese n'ezinaụlọ Idigo?

Otutu ndi ama ama n'ala Igbo biara akwamozu Eze Christopher Nwabunnwanne Idigo nke anọ n'Aguleri nwụrụ anwụ maka ikwanyere ya ugwu ikpeazu ụbọchị Fraide.
Igwe Aguleri ọhụrụ bụ Dr Michael Chinenye Idigo wakwara n'ama.
Mana ihe BBC Igbo hụrụ n'emume ahụ bụ ọnọdụ ndị n'ọchị,ndị n'akwa.
Ndị ọ bụ ọrụ ha ịkpọpụta onye ga-abụ eze n'Aguleri kwuru na obi adịghi ha mma.
Nke a bụ n'ihi ọ bụghị onye ha họpụtara wapụtara ama dika Igwe nke ise obodo Aguleri.

Mgbe bbc Igbo jụrụ ha onye wepụtara Igwe nke e chiri ụbọchị Fraide,ha kwuru na ọ bụ Gọvanọ Anambara steeti bụ Willie Obiano manyere ndị Aguleri eze ọhụrụ ahụ n'olu ka ọgbụrị ewu.
Mbọ niile Ndị ntakụkọ anyị gbara ịnụta uche Obiano, onye bụkwa nwa afọ Agụleri kụrụ n'ala.

Ndị mgbasaozi ya kwuru na ọ gaghị ekwuli okwu ụbọchị Fraide oge BBC Igbo kpọtụrụ ha.
Ha enyeghịkwanụ asịsa ọbụla ruo oge anyị wepụtara akụkọ.










