Ka iri ji Uburu Ohaozara siri kpọtụọ

Ebe foto si, Nnaemeka U. Trump
Ji bụ eze nri niile di n'ụwa, dịka Ndigbo siri kwekọrịta.
Ya kpatara e jiri wepụtara ya ụbochị pụrụ iche.
N'obodo ụfọdụ n'Alaigbo, ụbọchị e ji eri ji ọhụrụ bụ mbido afọ ọhụrụ ha.
Otu a ka ọ dị n'Uburu Adu nke dị n'okpuru ọchịchị Ohozara n'Ebonyi steeti.
Emume ji ọhụrụ nwere ọtụtụ aha n'Alaigbo.
Ndị Uburu n'onwe ha na-akpọ ya 'iri ji ọvụ' nke pụtara 'iri ji ọhụrụ' maọbụ 'Isu Ava'.
Ndị ọzọ na-akpọ ya 'ikeji,' 'ịhajiọkụ', 'iwa ji' na ọtụtụ aha ndị ọzo dị iche iche.
A na-eme emume iri ji n'Alaigbo kwa afọ site n'ọnswwa Ọgọstụ rue ọnwa Septemba.
Oge a bụ mgbe e ji egwuputa ji ọhụrụ n'ala.

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụkwa oge a ka e ji egwupụta akụkụ n'ụgbọ n'Alaigbo tupu a malite ọrụ ụgbọ ọzọ.
E jikwa mgbe dị otu a ezurukwa ike ọrụ n'Alaigbo tụpụ amalịte ọrụ ọzọ.
O nweghị onye ma ka ya bụ emume siri bido n'Alaigbo, mana ihe anyị chọpụtara bụ na iri ji nwere ugwu pụrụ iche Ndigbo n'akwanyere ya.
Emume na nganga sọ iri ji n'Alaigbo kariri akari nke bụ na ọtụtụ mmadụ na-esi obodo dị iche iche lọtacha obodo ha maka emume iri ji.
Ndị enyi, ọgọ na ikwu na ibe na-abịa soro rie ma ṅụkwa n'oge ahụ.

Ebe foto si, Nnaemeka U. Trump
Nke ndị Uburu Ado mere mgbe ọnwa Ọgọstụ 20, afọ a Gọvanọ Dave Ụmahị na oriaku ya bịara ebe ahụ, iji gosi ka ya bụ emume si dị mkpa.

Ebe foto si, Nnemeka U. Trump
N'otu aka ahụ, Ndigbo niile nọ n'ofesi na-emekwa emume iri ji.
N'obodo ụfọdụ n'Alaigbo ọ bụ Eze obodo maọbụ Ezemụọ na-aka mgbe eji eri ji n'ime onwa Ọgọstụ rue Septemba.

Ebe foto si, Nnemeka U Trump
Onye kọọrọ BBC ka esi mee emume iri ji nke afọ a n'ụbụrụ bụ Ojukwu Innocent Ene sịrị n'ụburu, ọ bụ onye ọgụ ava (onye na-agụ afọ) na-aka mgbe oge iri ji ohụrụ ruru.
Ọ bụ naanị ndị Ọgwụnta nke dị n'ime Uburu ka ọ bụ ọrụ ha ịgụ ya bụ ava (afọ).
"Ya bụ Ezemou na-eji ohere a kele Chukwu Abịama maka uju nri akọpụtara n'afọ ahụ, ọ kachasị ji" , dịka Ene siri kwuo.
Ọ kwụkwara na "n'Alaigbo, ji bụ eze nri. Ya kpatara ojiri bụrụ arụ mmadụ itukwu n'elu ji" agbanyeghị ka ugwu ejina onye ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
Ihe ndọhachị azụ dị n'emụme a bụ na ndị ọgbaraọhụrụ na-ahụtazị ememe iri ji dịka emụme arụsi.
Mana Ene kwuru na n'ezie emume iri ji enweghị ihe gbasara ya na arụsị.
"Ọ bụ emụme eji ekele Chineke maka ji ọhụrụ nakwa afọ ọhụrụ, ma ị kọtara ya ma ị gotere n'ahịa".
Ọ bụrụ na ekelecha orisaebuluwa maka onyinye a, onye ọbụla amalite iri ji.

Ebe foto si, Nnemeka U. Trump
Gịnị mere ji jiri bụrụ eze nri niile n'Alaigbo?
Ji bụ eze nrị nịịle maka onweghị ihe dị na ji na-alaniyi.
Esi ọtụtụ ụzọ eri ji.
A na-esu ya na mmanụ.

Ebe foto si, Nnemeka U. Trump
A na-ete ya ete, sụkwa ya ka nri onuno.
Eji ji eme ụrị n'ofe nke ga-eme ka ofe rọọ arọ.

Ebe foto si, Getty Images
Ya mere eji echị onye kachasị akọ ji na mba echịchị pụrụ iche.
N'Ụbụrụ Adọ nakwa ebe ndị ọzọ, a na-etụ onye ahụ Osuji.
Onwekwara ndị na-echị onye ahụ Di ji maọbụ Ezeji.
N'Ikem, onye kọtara ji gbara mkpị abụọ maọbụ ji ogene dịka ha na-akpọ ya, a na-etu onye ahụ Ezeji.
Dịka Ojukwu Ene siri gụpụtara anyị, ihe ndị a bụ ụrụ iri ji baara ndị Igbo.
Uru emume iri ji baara ndị Igbo
- Emụme iri ji na-eweta ohere maka mmekọ mmadu na ibe ya nakwa ndị nna nna anyị.
- Ọ bụ mgbe dị otụ a ka eji eme udo n'obodo dị iche iche n'Alaigbo.
- A na-ejikwa mgbe di otu a enykọrịta onyinye dị iche iche nke na-egosi ihunanya.
- Mgbe ahụ ka eji ekele Chineke maka ihe ọma omeere anyị site na-inye anyị nrị, ahụike, ihe akụakụ n'ihe enwenwe.
- O gosiri mmekọ na ịdị n'otu.
- Iri ji so n'isi omenala Igbo.
N'abalị ụbọchị a ga-eme emume iri ji, a na-ericha ji ochie nịịle iji nabata ji ọhụrụ.

Ebe foto si, Nnemeka U. Trump
Mgbe ahụ ji n'amalitekwa imebi, iji gosi na oge ya agaala.
N'ụbụrụ Ado, dika na ebe ndị ọzọ, a na-eji emume dị iche iche anabata ji ọhụrụ.
Ọ bụrụ na a gọcha ọfọ ya na ya sọ, nke onye Eze, ma ọ bụ Ezemụọ ga-eme, onye ọbụla amalite iri ji ọhụrụ.
Onye ọbụna gọrọ ya bụ ọfọ ga eji mmanu nri erie ya bụ ji ohuru ahụ tupu ndị ọzọ amalite.

Ebe foto si, Nnemeka U. Trump
Ezinaụlọ ọbụla ga-eji ihe ha nwere rie ji ọhụrụ.
Ụfọdụ na eji ọkụkọ, ebe ndị ọzọ na eji ewu n'ihi na ọ bụ ebe aka ruru nwaanyị ọ tụkwasa di ya.










