Trump o sị na ndụ afọghị n'ime Buhari?

Agbanyeghị na ọ bụ onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump kpọrọ onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ka ọ bịa n'Amerịka, ụlọ ntaakụkọ Financial Times edeela na Trump katọrọ Buhari ka ha mechara nzụkọ.
Financial Times, n'akụkọ ha dere maka nzukọ Trump na onyeisiala Kenya bụ Uhuru Kenyatta na Trump ga-enwe n'izu a, sị na Trump gwara ndị ọrụ ya na ya achọghị ka ya na-ụdịrị mmadụ a nwe nzụkọ ọzọ, maka na ọ hụru Buhari ka "onye ndụ adịghị n'ahụ".
Ụlọ ntaakụkọ a kwuru na ọ bụ ndị nọ mgbe ihe a mere gwara ha ihe Trump Kwuru banyere Buharị.
Buhari bụ onyeisiala mbụ si mpaghara ndịda Afrịka ya na Trump zutere.
Nzukọ a mere n'ọnwa Eprelu nke ọnwa.
Trump na Kenyatta ga-ezute taa ịkpa nkata maka azụmahịa na nchekwa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:






