Lee nwoke kwuru na ọ na-aha mmiri n'ala Igbo

"O nwere mgbe ụjọ tụrụ gị na mmiri nwekwara ike ghara izo dịka anyị nọ ebe a na-eche?" ka BBC jụrụ ya.
O weliri anya elu nwayọ nwayọ ka olu a na-anyị ya arụ, tụọ aka n'obi ya kwuo sị "Mụ? Ka ị na-ala taa, mmiri ozuzo ga na-achụ gị ọsọ."
Ka anyị mechara si Ọka na-alaghachị Enugwu na mgbede ahụ, nnukwu mmiri malitere zowe. O zoro nnukwu mere na ọ fọrọ obere ka anyị kwụsị ụgbọala anyị n'ụzọ.

O zogidere ruo mgbe anyị garuru Enugwu.
Ịchọta onye na-aha mmiri

Ọ bụghị taa ka akụkọ bidoro ịgagharị na e nwere ụmụnwoke na ụmụnwaanyị na-aha mmiri.
Ndị mmadụ na-ekwu na ndị a na-aha mmiri na-akpa ike ọfụma, ma na-eme ka mmiri zoo maọbụ ghara izo.
Ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na enweghị onye nwere ikike iji ihuigwe mee ihe masịrị ya ọkachasị ime ka mmiri zoo; na ọ bụ aghụghọ.
Ndị ụlọọrụ 'Nigerian Metrological Agency' bụ ndị ọkachamara gbasara ụdịrị ihe a na Naịjirịa kwuru sị na enweghị onye nwere ike ime ụdịrị ihe a.

Ọtụtụ ndị na-aha mmiri juru na Naịjirịa. Ha na-eji ịha mmiri n'emume dịka akwamozu, ụbọchị ncheta ọmụmụ nakwa ndị ọzọ akpa ego.
Ụfọdụ akụkọ na-ekwu na ndị mmadụ na-akpọku ndị na-aha mmiri ka ha jiri mmiri mebie emume onye iro ha na-eme.
O were BBC ọnwa anọ ịchọta Godwin Onasedu bụ onye na-aha mmiri n'obodo Ifitedunu dị n'okpuruọchịchị Dunukọfịa n'Anambara steeti, kwere ka anyị maa ya aka ịma ma ọ bụ eziokwu na ọ ga-emenwu ka mmiri zoo.
Onasedu kwuru na e ji ịha mmiri mara ezinaụlọ ya kemgbe ọgụ afọ.
Ihe e ji aha mmiri
Iji mee ka mmiri gbadata, o kwuru ka anyị weta ihe ndị dịka:
- Kreeti mmanya biya abụọ
- Otu karama kaịkaị 501
- Mkpụrụ ọjị anọ
- Puku naịra a ga-eji awa ọjị
- Kandụlụ, akwa ọcha nakwa nke ọbaraọbara maka ụbọchị ahụ.
Ụbọchị akara aka

Anyị zutere ya n'ihu ụlọ ya ka ọ na-akpọ ahịhịa ọkụ, sị na ọ na-achụ mmiri ozuzo, n'ụbọchị Ọgọst 17, 2018.
O kwuru sị "e nwere ndị na-eme akwamozu nyere m ọrụ ka m jidere ha mmiri, mana ebe ọ bụ na ị chọrọ ịnwa ike m, aga m ewedata obere mmiri ozuzo na-agaghị ezote aka."
Anyị nyere ya ihe ndị ọ sị anyị weta maka ịchụ mmiri, ọ gwara onye na-enyere ya aka ka ọ wụnyụọ ọkụ aha ka a gaa mezuo nke fọrọ afọ n'ụlọarụsị.
Site n'ihe o kwuru, ọkụ ọ na-amụ na-achụpụ mmiri ozuzo ahụ; ọkụ ahụ kwụsị ire, mmiri ga-ebido izo.

N'agbanyeghị na ọ bụ oge udummiri ka a nọ, anwụ nọ na-acha ụbọchị ahụ, mana oge anyị nyochara ihe Google nwere ikwu maka mmiri izo ụbọchị ahụ, o kwuru na mmiri ga-emecha zoo ụbọchị ahụ.
Ndị obodo nụrụ maka ihe chọrọ ime gbakọrọ sowe anyị; nne, ndị nne, ndị nna ma ụmụaka so anyị n'azụ ka Onasedu yi uwe ọcha n'ahụ nakwa n'isi du anyị na-aga.
Ụlọarụsị ya bụ osisi abụọ toro ezigbote ogologo ekere ụdọ nakwa akwa na-acha edo edo nakwa ọbara ọbara.
Karama kaịkaị dịbu n'ime ya nakwa ihe ndị ọzọ anyị amaghị tọgbọcha n'ala ebe ahụ.

Ọ malitere ịkụ ogene ya nakwa ịkpọku mmiri ihe ruru nkeji 45 mana mmiri ezoghị, ndị mmadụ malitere ịlaghachị ụlọ ha ka ọ kwụsịrị.
Ọtụtụ ihe mere n'ime awa abụọ anyị nyere ya ịha mmiri, dịka otu onye isi na-adịchaghị mma gara n'ụlọ bido ọkụ ahụ a wụnyụrụ, nke onye na-enyere Onasedu aka kwuru kpatara mmiri ezoghị.

Mmiri bidoro izo obere obere, gbanwee ihu igwe.
O zoro naanị nkeji ise tupu ọ kwụsị. Mmiri ahụ ezosịghị ike, mana ọ bụ ụdịrị nke na-eme ka ala dịrị mmiri mmiri.
Ndị mmadụ ga-ekweta ihe ha ga-ekweta, mana ihe anyị ma bụ na mmiri zoro n'ezie.











