Ị ma na onye Igbo niile nwere ike ịbụ 'dibia' na-agwọ ọrịa?

Ebe foto si, Getty Images
Onye Igbo ọbụla nwere ikike ịbụ dibia na-elekọta ahụike ma ọ bụrụ na ọ ma ihe ọ ga-ejinwu akwụkwọ ndụ dịka nke a na-akpọ 'akpụrụ' eme.
Ị ma na akwụkwọ ndụ a kpọrọ 'akpụrụ', 'akukolo' maọbụ 'ahịhịaọbara' na-enye ọbara n'ahụ nke ọma?
Ndị ma anya ya ọkachasị mgbe gboo ma na ọ bụrụ na ọbara adịghị gị n'ahụ, na ọ ga-eme ka ọbara gị gbalite ma ọ bụrụ na ị ṅụọ ya, kama ịga ụlọọgwụ nara ọbara mmadụ gbanye n'ahụ.

Ebe foto si, Maazi Ogbonnaya/Facebook
Etu akpụrụ si 'agwọ ọrịa'
Mgbe gboo, ndị nne na nna na-eji ya emeju ọbara ezinaụlọ ha site n'isi ya esi ṅụọ mmiri ya.
- Ị sichaa ya n'ọkụ, mmiri ya ga-ebido ịcha ọbara ọbara.
- Wụnye mmiri ya n'ime iko gị ma wụnyekwa ya mmiri ara ehi, ṅụọ ya ka tii.
- Ọsụsụ ga-ebido ịsụ gị, mgbe na-adịghị anya, ọbara gị ga-agbalite.
- Ụfọdụ na-eji ya esi nri dịka ji maọbụ ofe, ebe ụfọdụ na-ata mkpụrụ ya nke na-atọ ka aṅara.
Ebe ị ga-ahụ 'akpụrụ'
Ị nwere ike ifopute akpụrụ n'azụ ụlọ gị. O nwere ike ito n'etiti akwụkwọ nri ndị ọzọ. Naanị ndị ma anya ya ga-achọpụtanwu ya maka na ọ na-eyi ụfọdụ akwụkwọ nri ndị ọzọ.
A na-akpọ akwụkwọ 'akpụrụ' a 'fig leaves' na Bekee.
Lee ihe ndị mmadụ kwuru ka BBC Igbo gwara ha uru akwụkwọ nri a bara na Facebook.

Akụkọ ga-amasị gị









