Fresh FM: 'Gọọmentị kuturu ụlọọrụ m maka ndọrọndọrọ ọchịchị' - Ayefele

Ụlọ Yinka Ayefele

Ebe foto si, Sina Olabode

Nkọwa foto, Nke mere ya ugbo abụọ gọọmenti tinyere aka n'ụlọ a

Gọọmentị Oyo state n'utụtụ taa kuturu ụlọọrụ Fresh FM bụbụ ụlọọrụ onye otiegwu aha ya bụ Yinka Ayefele.

Ihe a mere na-ebe akpọrọ Challenge n'ime isi obodo steetị ahụ bụ Ibadan.

Gọọmentị kwuru na ha mere ihe a makana Ayefele lụrụ ụlọọrụ a na-ebe o kwesighị ịlụ ụlọ.

Mana Ayefele na-agọ ebubo a, o kwuru na gọọmentị na-emegbu ya maka ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị.

O kwukwara na akwụkwọ ikike ya ịrụ ụlo a zuru ezu. Ọ sị na ka ọ dị ugbua, a na-enyocha okwu a n'ụlọikpe.

N'eziokwu, okaikpe I. Yerima kpebiri na ụbọchị 20 n'ime ọnwa a ga-abụ ụbọchị a ga-elebe anya na yabụ okwu.

Ajumobi na Ayefele

Ebe foto si, @YINKAAYEFELE/@TOLANIALLI

Nkọwa foto, Ajumobi na Ayefele

Ihe a bụ ihe mere ikutu ụlọ a taa jiri tụọ ndị mmadụ n'anya makana gọọmentị gara n'ihu kutuo yabụ ụlọ na-agbanyeghị na okwu a nọ n'ụlọikpe.

Ihe mere taa

Yinka Ayefele gwara ndị ntaakụkọ na ndị ụlọọrụ gọọmentị na otu nnukwu ụgbọala na-akutu ụlọ biara ụlọọrụ ya n'elekere anọ n'ụtụtụ taa.

O kwuru na; "Oge anyị pụtara ka anyị hụrụ na ha bụ ndị gọọmentị. Mgbe ahụ ka anyị bidoro iti mkpu"

Ha kuturu yabụ ụlọọrụ n'ime otu elekere. Ugbua igwe mmadụ nọ ebe ahụ na ekiri ihe mere.

Gọọmentị gbara ụlọọrụ Ayefele akwụkwọ n'ụbọchị monde, na ha ga-abịa ịkutu ụlọọrụ ha na ngwụcha ụbọchị atọ.

Aziza gọọmentị

Kọmịshọna na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Toye Arulogun gwara onye ntaakụkọ BBC na ebubo Ayefele boro gọọmentị na ha na-emegbu ya maka okwu gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị abụghị eziokwu.

O kwuru na akuturu ụlọọrụ a makana ọ dị n'akụkụ okporoụzọ.

O kwukwara na Ayefele nupuru isi n'iwu makana oge ọ lụrụ ụlọ a, o kwughi na ọ ga-eji ya mee ụlọọrụ mgbasa ozi redio.

Akụkọ ga-amasị gị