Abuja: Etu otu nwoke siri gbalahụ ọdachi ụlọ elu dara

Ụlọ dara ada
Nkọwa foto, Ndị ọkachamara kwuru na ọ bụ amaghị arụ butere ọdịda ụlọelu ahụ

Otu onye ọrụ so arụ ọrụ ebe ahụ ụlọelu ana arụ arụ dara n'Abụja kọwara na ọ bụ oge ya gbadara ala ibute aja ibugo elu ka ya hụrụ n'ụlọ ahụ n'ada nke nyere ya ohere ịgbapụ ọsọ ndụ.

Nwoke ahụ a kpọrọ Usman Abdullahigwara BBc sị, "Ana m achọ ịgbago elu oge m hụrụ ka ụlọ gbawara na-achọ ịda, m were tipụ ọsọ."

Agbanyehị na Abdullahi zọtara ndụ ya, ọtụtụ ndị ya na ya na-arụ ọrụ ka tọrọ n'okpuru ụlọelụ ahụ dara na Jabi dị n'Abuja n'ụbọchị Fraide ma tigbuo mmadụ abụọ.

Osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo agalarịi ebe ahụ ihụ ihe mere ma tie ndị ihe mere aka n'obi.

Osinbajo kwuru na afọ juru ya maka ọrụ gbatagbata a na-arụ ebe ahụ.

fct
Nkọwa foto, Osinbajo kwuru na o nwere olileanya na aga-agbapụta ndị ka tọrọ n'okpuru ụlọ dara nụ

Osinbajo kwuru na o nwere olileanya na a ga-agbaputa ndị niile ka tọrọ n'okpuru ụlọ elu a.

Ụlọ ọrụ ndị gbatagbata a kpọrọ 'FERMA' kwuru na agbapụtala mmadụ isii,mmadụ ise agaala n'ụlọ ọgwụ Asokoro ebe otu onye nwụrụ.

FCT
Nkọwa foto, Minista na-ahụ maka FCT biara ebe ihe a mere

Mberede a e butela nnukwu ahịrị ụgbọala makana ndị mmadụ gbakọtara ebe ahụ na-ekiri mkpa mkpa a kparanụ.

Ụlọ a dara ada dị nso ụlọahịa a kpọrọ "Panda Shopping Mall."

Ihe ndị ọkachamara kwuru

Ndị nọ ebe ihe a mere kwuru na ihe karịrị mmadụ iri ka tọrọ n'ụlọ elu ahụ dara ada.

Ulọ dara ada
Nkọwa foto, Ndị gbata gbata na-agba mbọ ị gbaputa ndị mmadụ ka tọrọ n'ụlọ a dara ada.

Ndị kara mara na-ekwukwa na-arụzighị ụlọ ọfụma nke mere o ji wee daa.

A rụrụ ụlọ ahụ ihe karịrị afọ iri gara aga mana ihe ruru ọnwa atọ gara aga, e bidoro ịrụkwasa ụlọ n'elu ya.

Onyeisioche FCT na-ahụ maka ụlọ obibi kwuru na arụzịghị ụlọ ahụ dịka o kwesiri.

Ndị ọrụ n'ụlọ elu a aka na-arụ arụ nakwa ndị na-ere ahịa mbụgharị ka tọrọ n'ime ya bụ ụlọ elu.

Ụlọ dara ada
Nkọwa foto, Ndị akaebe na-ekwu na ihe kariri mmadụ 50 na-arụ ọrụ n'ụlọ ahụ

Ndị ọrụ gbatagbata ka nọ ebe ahụ na-agba mbọ ị gbapụta ndị ka tọrọ n'ụlọ ahụ dara ada.

Ebugala ndị meruru ahụ na mberede a ụlọọgwụ.

Onye gbara ọsọ ndụ mgbe ihe mere kwuru na ihe ruru mmadu iri na ise na-arụ ọrụ n'ụlọ ahụ.

N'ọnụ ya," ụlọ a anọọla afọ asaa ebe a."

Mmiri ozizo chụsasiri ndị mmadụ gbakọtara i kiri ihe na-eme ebe ahụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: