Ị ma ihe ọzọ 'Igbo' na-eme n'ahụ mmadụ karịa ịkwụsị ahụ mgbu?

Aha onyonyo, Ihe ise 'Igbo' na-eme n'ime ahụ

Bekee nakwa ndị Igbo na-eme nyocha ma na-achọpụtakwa ihe ndị ọgwụike akpọrọ 'Igbo' na-eme n'ime ahụ mmadụ.

Achọpụtala ugbua na ọ na-enye aka ibelata ahụ mgbu nye ọtụtụ ndị mmadụ na-arịa ọrịa.

BBC Igbo gbara otu onye dibia bekee ajụjụ ọnụ n'okwu gbasara ise Igbo iji maata ihe ndị dị mma na ndị dị njọ maka ya.

Ọ dọọla aka na ntị kwuo na ọ ka mma na mmadụ ebidoghi ise ọgwụ n'ihi na ọ naghị ekwe nkwụsị gụnyere ihe ndị ọzọ ọ na-eme n'ime ahụ mmadụ.

O kwukwara na ụfọdụ mmadụ na-agbapụ ara n'ihi ọgwụike a.

Gee ihe ọ gwara BBC n'uju n'elu:

Akara ntụ-ntụ

Lee ihe 'Igbo' nwere ike ime na ndụ mmadụ:

1. Ọ na akwụsị arụ mgbu

Okoloto Igbo

Ebe foto si, AFP

Agụnwa ekwuola ụfọdụ ihe ndị mmadụ na-ekwu na mbụ mgbe ọ gwara BBC na Igbo na-ebelata ahụ mgbu n'ihi n'ọnwere ike ị me ka ahụ maadụ daa juuu.

2. Ọ na-eme ka nwoke na-achọ nwaanyị nakwa nwaanyị na-achọ nwoke.

Nwoke na iko ya

Ebe foto si, Getty Images

Ọ bụ ihe ọma diri ụfọdụ mmadụ ị ji Igbo dịka ọgwụ enyemaka na mmekọahụ, mana ụfọdụ oge kwa, ọ na-eme ka mmadụ ghara ị mekọahụ ma ọbụrụ na ha esghị Igbo.

3. Ọ naghị agwọ orịa ịkpa

Osisi na-amị Igbo

Ebe foto si, Getty Images

Dịka ọgwụ na-enye aka ị belata ahụ mgbu, ọ naghị agwọ ọrịa ọbụla ọzọ kachasị ọrịa ịkpa bụ 'Cancer' na bekee. Sọsọ ihe o nwereike i me bụ ị belata ahụ mgbu ndị na-arịa ọrịa ahụ.

4. Ọ na-agbanwe ime ahụ mmadụ n'ụzọ adịghị mma

Onye na-ese Igbo

Ebe foto si, AFP

Ọ bụ n'ụbụrụ ka mgbanwe a kachasị na-egosi. Ọ na-eme ka onye na-emebu ihe ghara i nwe ike i me ihe ọ na-eme tupu o bido i see ya bu ọgwụike. Ya mere na ọ ga-eme ka ọ na-ese ya oge niile.

Ọ na-eme ka agwa mmadụ na-agbanwe agbanwe oge ọbụla dịka onye na-achọ ịgbapụ ara.

5. Ọ naghi ekwe nkwụsị

Onye na-ese Igbo

Ebe foto si, AFP

Ọ ka mma na mmadụ ebidoghi ise ọgwụ n'ihi na ọ naghị ekwe nkwụsị

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ