Ndị ogbuaraọbara gburu nwoke n'okpuru ọchịchị Nwangele
Egwu bara ndị mmadụ ahụ ụnyaahụ n'Amaigbo, nke dị na okpuru ochịchị Nwagele dị n'Imo steeti mgbe ndị ogbuaraobara ji ụgbọala egbagbụrụ otu nwoke were gbafere ọsọ.
Nwoke aha ya bụ Theo Mbakwe kwụ n'ihu be ha mgbe ndị omekome a gbakaranyere ya egbe n'ụbọchị satọde.
Otu onye BBC kpọrọ bụ onye Amaigbo bụ Duke Olueze Ukaeje kwuru na ya bụ ihe menyere onye ọbụla ụjọ n'ahụ ebe ahụ.
Ukeje kwuru na onweghị onye maara ndị kpara ike a ka ọ dị ugbua ma kwukwa na nna Theo Mbakwe anọghịzị ndụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị ụweojii n'Imo steeti bụ Andrew Enwerem kwukwara na nke a bụ eziokwu sikwa na ndị uweoji bugara ya bụ nwaamadị ụlọọgwụ ebe ndị dọkịnta nọ kwuo na ọ hapụla.
Ka ọ dị ugbua, ndị uweojii amabeghị ndị kpara ike a, mana ha ka na-etinye anya na ya.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ntọ kpara ike n'Owere Nkwoji
Ka a na-ekwu nke a, n'otu ụbọchị ahụ, ndị Owere Nkwọji dị n'okpuruọchịchị Nkwere kwara ndị ntọ ọbịa bụ ebe ha nọ tọrọ otu nwoke na enyị ya nwaanyị, dị ka Enwerem gwara BBC.
Ndị ntọ a tọọrọ nwoke a na enyị ya nwaanyị na ụgbọala ha.
Dịka osi kwuo, "ndị ntọ a gbahapụrụ ya bụ ụgbọala n'Amuizu n'okpuruọchịchị Nkwere ebe ndị uweojii na-achụ ha ọsọ".
Enwerem sị na ndị ntọ ahụ buru ndị ha jị tinye n'ụgbọala Hilux ọzọ ha natara mmadụ were gbafuo.
Mana ka ọ dị ugbua, ọ sịkwa na ha jị teknụzụ na ama imi n'ala ịchọta ebe ndị omekome ahụ buru ndị ahụ gawa.
Ọ gbakwara ama na ha enyopuola ebe ha nọ kama na ha na ebereebere tupụ ha jugbuo ka ha ghara imeru ndị ha ji ahụ.













