BIM: Ndigbo bịa kwụọnụ ụtụisi n'ụlọọrụ anyị

Ralph Uwazuruike, onye ndu MASSOB

Ebe foto si, Getty Images

Ralph Uwazuruike bụ onye ndu ndị Biafra Independence Movement ekwupụtala atụmatụ ị na ụtụisi ndị Biafra nke afọ 2018.

Uwazuruike, onye bụbu onye ndu Massob kwuru na ọ bụ atụmatụ a na-eme kwa afọ iji nweta nwereonwe Biafra n'ụzọ udo na-enweghi ọgbaghara ọbụla.

Ozi a si n'aka onye enyemaka ya na mgbasaozi bụ Chris Anierobi Mocha bụ o zigara ndị akwụkwọ akụkọ Vanguard n'Owere.

Uwazuruike gwara Ndigbo ka ha nwee mpako na ha si n'agbụrụ ndị Igbo nakwa ala Biafra pụta.

Ọ gara n'ihu gwa ndị Igbo ka ha gaa n'isi ụlọọrụ ndị BIM dị icheiche dị ha nso ga kwụọ ụgwọ ụtụisi ha, nke o kwuru na ọ bụ onye o metụrụ n'obi.

Uwazuruike kwuru na ọ na-ahụta mba ise ndị ọzọ ga-esi na Naịjirịa kewapụta, kwuo na ọ bụ nke a ga-akwụsị ntaramahụhụ na ọchịhchị ọjọo dị na Naịjirịa ugbua.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: