'Gọọmentị Buhari tọghapụ ụmụnwaanyị Ipob' - ICCA

Ebe foto si, Getty Images
N'akwụkwọ ozi ha degara BBC ha kọwara agwa gọọmentị kpasoro ụmụnwaanyị a dika oke mmegbu akpachara anya eme ndị Igbo.
Ha kwukwara na ihe mere nụ ga-eme ka ọgbaghara daa n'Obodo.
Onyeisi otu ICCA bụ Ugochukwu Okoro kwuru na ndị otu ha na-adọ aka na nti gbasara ụzọ ọchịchị Buhari sị asa ihe gbasara ndị Igbo ga-ebute nsogbu ma ọbụrụ na-akwụsịghị ya.
"N'ọnụ ha,"nwụchị a anwụchiri ụmụnwaanyị anyị ruru 114 na-eme ngagharị iwe n'udo maka mmegbu a na-emegbu ndị Igbo dika ndị nwere ikike ime ya bụ nnukwu nsogbu."
Okoro kwuru na eji mkparịtaụka wee mara ndị Igbo n'igbo nsogbu ọ bụla ha na ndị ọzọ na-enwe ma na-ayọkwa ndị ntorobia ka gharị ikw ka onye ọbụla mechie ha ọnụ sịte n'imekpa ha ahụ.
"Anyị chọrọ ka mwakpo a na-awakpọ ndị Igbo kwụsị."
Anyị na-agwa gọọmentị ka a tọhapụ ụmụnwaanyị 114 ụlọikpe S.K. Kadurumba nyere iwu ka akpọchie.







