MASSOB ebola gọọmentị etiti ebubo ịgbasa ozi alakụba

Okoloto njiri mara Biafra

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Otu ọzọ na-achọ mwere onwe Biafra ekeela ụbọchị 30 May ụbọchị ncheta Biafra

Onye ndu otu na-achọ nwereonwe Biafra a kpọrọ BIM n'aha ịchafụ bụ Ralph Uwazururike ekwuputala uche ya maka oke ogbugbu na-aga na mpaghara ugwu Naịjirịa.

O si na ihe butere nke a bụ na gọọmentị etiti na-achọ ị gbasa ofufe alakoba na gburugburu Naịjirịa ga-eme ka ọ ghọọ mba ụka alakoba.

Onye na-ekwuchitere otu BIM bụ Mazi Chris Mocha kwuru nke a ebe a na-eme emume nturugo Anaocha emere n'Ọnịcha.

N'ọnụ ya "Cheta na ihe yiri nke a mere n'afọ 1811 mgbe e gburu onyendu ndị Yoruba na Kwara steeti ma nara ọchịchị ebe ahụ rue ugbua".

Ọ sị nke a gosiri na mwakpo ahụ na-eme na Benue, Taraba na Nassarawa bụ ihe yiri ihe a na-achọ ime ọzọ.

O ji kwa ohere ahụ ị gwa ndị Igbo ha kpachara anya ma dịkwa njikere n'ihe gbasara nchekwa onwe ha.

Ọ sị "ọ bụ ndị Igbo ka ọgbaaghara si n'ọgụ ofufe na-emetụta karị...ya mere ha ga-eji saa anya mmiri n'usoro a ị gbanwe Naịjirịa dịka mba ụka alakoba".

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ