Kirie foto ka emume Ista si gaa n'ala Igbo

Dịka foto ndị na-agụ anyị zitere, emume Ista a bụ ọtụtụ ihe nyere ọtụtụ ndị n'ala Igbo.

Emume Ista

Ebe foto si, Chioma Okoroeni/Ephraim Chukwu/Jerry Okafor

Nkọwa foto, Oke mmanwụ gbara na mpaghara Asata, Enugwu ụnyaahụ. Ndị ogbe ahụ tiri mmanwụ iji kpọghachite omenala nke ha sirị na-achọ ịnwụ anwụ. Ọtụtụ na-ebe akwa na ụka achụpụla omenala nke mere na onweghịzị ihe eji enwe aṅụrị ihe dịka ugbua. Ya mere Ista a jiri bụrụ ihe ukwu n'ogbe ahụ.
Emume Ista

Ebe foto si, Ebere Ekeopara/Bismack Oji

Nkọwa foto, Enugwu niile kwụ na Shoprite n'oge a. Ọtụtụ n'ime ha bịara nkiri anya ebe ụfọdụ bịara ịzụ ahịa. Ụmụaka bịakwara igwu egwu dị iche iche. N' ụlọ oriri Spar, Oakland nakwa Shoprite dị n' Enugwu, nne na nna, ụmụ ntorobịa nakwa ụmụaka juputara na enwe aṅụrị Ista.
Emume Ista

Ebe foto si, Bismack Oji/Chioma Okoroeni

Nkọwa foto, Ọtụtụ gbakwara nkwụ n'obodo dị iche iche n'ala Igbo. Nke a bụ ịgbankwụ Ifunanya Chukwu na Ifeanyi Okoro n'obodo Emodu-Nenwe, Aninri LGA, Enugwu Steeti.
Emume Ista

Ebe foto si, Chidi Malachy Ani

Nkọwa foto, Na Ngwo Enugwu, ihe ụmụokorobia jiri malite ụbọchị ha n'ụtụtụ ụnyaahụ bụ ụka, bụ egwu bọọlụ nke ndị ogbe. Etu a ka ọ dị n'ọtụtụ ebe n'ala Igbo. Ụbọchị ezumike niile na-abụ ụbọchị ezumike n'egwuruegwu.
Emume Ista

Ebe foto si, Ikechukwu Okafor

Nkọwa foto, N'ọtụtụ ime obodo n'ala Igbo, ndị ọnụ na-eru n'okwu gbakọrọ ịkpa maka mmepe obodo. Ndị a bụ ndị Amuvi, Arochukwu mgbe ha họpụtara ndị isi ọhụrụ nke onyendu ha bụ Ikechukwu Okafor
Emume Ista

Ebe foto si, Emmanuel Izuchukwu

Nkọwa foto, Ebe obodo ndị ọzo ka nọ n'emume Ista, ndị Aba nọ n'ahịa tata bụ Ista Monde. Ebe ọtụtụ n'ime ha gara ụka ụnyaahụ ma mekwaa emume dị n'ime ya, ọtụtụ ndị ọzọ gakwara ahịa. Mana nke tata dịzị ka onweghị emume a na-eme.