Ekwulobia Royal Stool: Ọtụtụ ndị obodo Agba gbara igwe ha alụkwaghị m

Ndị ichie

Ndị mmadụ na-achọ imata nke bụ eziokwu n'esemokwu dị n'etiti ndị obodo Agba dị n'Ekwulobia na Igwe ndị Ekwulobia bụ Igwe Emmanuel Onyeneke.

Akụkọ pụtabụrụnụ na-ekwu na ndị Obodo Agba kwuru na ha na Igwe ha agaghị enwe mmekọ ọbụla.

Nke a mere ka BBC gbaa onye chibụru dịka onyeisioche 'Agba Development Union" nke ngalaba Legos ma chikwaa dịka onyeisioche ngalaba ehiwere maka udo na Ekwulobia bụ Chibueze Ezegwu

ajụjụ maka ihe na-eme.

Aha onyonyo, Ọgbaghara sochiri echichi Igwe Aguleri ọhụrụ

Ezegwu kwuru sị " Kamgbe Igwe banyere n'oche Eze, nsogbu dị, mgbe ọbụla a sị ka-eme ụdo, ịgwe na-ajụ",

N'afọ 2016 ka ndị ofufe dị iche iche biara ikpe udo mgbe Igwe na ndị otu ya kpọrọ ha ka ha kpee udo.

O kwukwara na mgbe ndị ofufe a mechara nyocha ha, ha gosiri ya ndị Ekwulobia nke Igwe kwenyere.

Kama mgbe ọ lara ọ megharịrị ma jụ nchopụta ndị otu udo a mere.

Nke mere ka ndị obodo Agba nwee nzụkọ ma mee ntụliaka imara ma ha a ga akwụsị i ga be Igwe.

Aha onyonyo, Ọnwụ Igwe: Ihe kpatara ya

Mmadụ narị abụọ na otu kwetere na ha agaghi enwezị ndi nnọchite anya n'obi Igwe ebe mmadụ abụọ kwenyere na ha ga-enwe ndị nnọchite anya na nke Igwe.

Mgbe ha kpebiri nke a , ha degara Igwe na ndị Ekwulobia niile akwụkwọ ma gwa ha ebe ndị Agba kwụ.

Ezegwu kwuru sị " Anyi degara Igwe na ndị Ekwulobia akwụkwo gwa ha na ndị Agba agaghị enwe ndị nnọchite anya na nke Igwe ruo mgbe ọ bụla igwe chọrọ udo"

Mbo niile BBC gbara inweta Igwe Emmanuel n'ekwentị amụtaghi mkpụrụ.

Akụkọ ka na-abịa.

Akụkọ ga-amasị gị