Duncan Mighty: Ndị Uweojii atọhapụla oti egwu a

Ebe foto si, Instagram/@duncanmighty
Oti egwu a ma ama bụ Duncan Mighty enwerela onwe ya n'aka ndị uweojii Imo Steeti.
Nke a bụ ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru ndi uweojii n'Imo steeti bu Orlando Ikeokwu.
Ikeokwu kwuru na otu onye ọnụ na-eru n'okwu bịara gbaara Duncan Mighty akaebe nke mere e ji tọhapụ ya.
Mana ọ ga-abịaghachi n'ụlọọrụ ndị uweojii n'izuuka na-abịa abịa.
N'ehihie Satọdee ka akụkọ malitere rịwa ibe ya elu etu ụmụ dimkpa bucha egbe si nwụchie Duncan Mighty n'Owere.
Ọtụtụ ndị mmadụ che na ọbụ ndị ntọrị tọọrọ ya.
Mana ndi uweojii kọwara na ọbụ ha nwụchiri ya.
Orlando Ikeokwu kwuru na ha nwụchiri nwa amadị a maka nrụrụaka dịka ulọikpe nyere iwu ka ejide ya.
Maazi Ikeokwu sị na ọ bụ maka ego aka chiburu Imo steeti bụ Rochas Okorocha nyere oti egwu a ka ya na onye egwu ọzọ aha ya bụ M2 jiri kụọ egwu.
Dịka Ikeokwu siri kọwa, ha nwụchiburu Duncan Mighty dịka M2 wetere ha mkpesa, o wee kwee nkwa na ya ga-emezu nkwekọrịta ha.
Ego na-ese okwu bụ nde naịra iri na otu (N11 million) bụ nke Gọvanọ Okorocha nyere Duncan Mighty.
Ikeokwu sị na ha hapụru oti egwu mgbe ahụ, mana o meghị ihe ọ sị na o ga-eme.
Onweburu oge Duncan Mighty tiri mkpu maka ihe ọ sị na ya na-agabịga maka okwu a.
M2, onye ezigbo aha ya bụ Amaechi Perfect Gideon, bụ onye mbem a ma ama na steeti Imo nke mere gọọmentị steetị ahụ jiri chọọ inyere ya aka.
Ndị uweojii sị na ọ bụ ụlọikpe nyere ha ikike ha ji nwụchie Duncan Mighty bu onye ha sị nọ n'ogige ha n'Owere ugbua.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:









