Chelsea v Bournemouth: Bournemouth akụnyela Chelsea ikputu ọnụ

Ndí Chelsea emeriri emeri

Ebe foto si, AFP/Getty Images

A ka nwereike ịzọpụta otu Chelsea na izu Premier League a?

Ọ bụ ajụjụ ndị mmadụ kpụ n'ọnụ dịka otu Bournemouth mere ka ala meghe ọnụ loo ha bụ Chelsea mgbe ha zutere onwe ha.

Ihe bụ isi sekpụ ntị n'okwu bụ goolu Gosling nyere na nkeji 84 dịka asọmpị ahụ na-erute na njedebe.

Hudson-Odoi nwara ịsachachi ọkpụ ahụ ugboro abụọ na nkeji 90 mana ọ mịtaghị mkpụrụ.

Ihe kachasị wute Chelsea na mmeri a bụ na e meriri ha na be ha bụ Stamford Bridge.

Chelsea na-enwe olileanya na ha ga-abanye n'otu iri na isii ikpeazụ.

Otu Tottenham na-echezi ha n'ihu ugbua.

Akụkọ ndị ga-amasị gị