Youth Empowerment: Ị ma ntorobịa bụ 'ewu akpụkpa ntị'? Lee etu ị ga-esi kwa nku ya

Nwata na-agba egwu

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo

Ị ma ntorobia na-eme isi ike maọbụ nke a na-anaghị ata ntị ya ata? Anyị chọrọ ịgwa gị etu ị ga-esi kwa nku ya.

Dịka ụfọdụ ụmụakwụkwọ na-enupu isi, na-eti ndị nkuzi ha ihe, nakwa ndị nke na-eti ibe ha ihe, akparamagwa ndị a so na ndị na-enye ndị nne na nna na ndị ọzọ nchekasị gbasara ọzụzụ ha.

Ndị Afrịka kwenyere na otu onye anaghị enwe nwa, nke bụ na nwatakịrị gbaa isi akwara na ọ gaghị akpazi agwa ọfụma, ụfọdụ ndị ga-achọ itinye aka hụ na ọ pụtara mmadụ.

Ụfọdụ ihe ndị ntorobịa na-enye nsogbu na-eme:

  • Ịṅụ ọgwụ ike
  • Ọgụ na mgba
  • Esemokwu
  • Ịṅụ oke mmanya
  • Ịchụ oke nwaanyị
  • Ịkparị mmadụ
  • Nkonukọ ndị enyi na-adịghị mma
Onye ike gwụrụ

Ebe foto si, Getty Images

BBC Igbo kpọrọ ndị ọkachamara n'ihe gbasara mmekọrịta ọha ebe ọ metụtara ndị ntorobịa, ndị gwara BBC Igbo etu ị ga-esi ejikwa ntorobịa.

Etu ị ga-esi jikwa ntorobịa na-enye nsogbu:

  • Bụrụ enyi ya:

Ihe ọma ị ga-emenwuru ntorobịa na-eme isi ike bụ igosi ya na ị bịaghị ịta ya ụta, na ọ bụ enyi ya ka ị chọrọ ịbụ.

Gosikwa ya site n'inye ya ntuziaka si n'ihe ị mụtara ka ị na-eto, ahụmihe ị hụrụla n'ụwa nakwa ihe ndị ị mụtarala n'ahụmihe ndị ọzọ ọkachasị gbasara ọnọdụ ọ nọ mgbe ahụ.

Na-akpanyere ha nkata, kpọrọ ha pụọ apụ, ebe ị ga-esonwu ya mee ihe ga-enye ya ọṅụ, ka o nwee ike inye gị ohere ịmata ihe na-aga n'uche ya.

Ime nke a ga-egosi ya na ọ bụghị nkarị ka ị chọrọ igosi ya, kama na ọ bụ ihe ọma ka ị chọrọ imere ya. Ọ ga-emekwa ka onye ahụ nwee ike ịbịakwute gị ma o nwee nsogbu.

  • Nye ya ohere ikwu uche ya:

Ntorobia meta ihe e ji abara ya mba dịka ịlụ ọgụ maọbụ imebi ihe, buru ụzọ gee ya ntị mara ihe mere o ji mee ihe o mere; kama ibido bawa mba maọbụ iti ya ihe.

Ịjụ ya ụdịrị ajụjụ nchọpụta a ga-eme ka i nwee ike ịmata ihe mere o ji kpaa ụdịrị agwa ahụ ọ kpara mgbe ahụ, ma mara etu ị ga-esi gbochie ya ka ọ ghara ime ọzọ.

  • Bụrụ onye a ga-eṅomi:

Kama ịbụ 'onye oke ekwurekwu', bụrụ onye 'oke omume'.

Nke a bụ makana ụmụaka na ntorobịa na-aka amụta ihe site na ṅṅomi karịa site n'ihe ị gwara ha mee.

Ị ga-agba mbọ hụ na ị na-eme ihe ọma n'akụkụ ha, ka ha nwee ike si n'ahụmihe gị mụrụ akọ.

  • Tụkwasị ya obi:

Ịtụkwasị mmadụ obi dị ka inye ya ọrụ nke a na-akpọ 'Responsibility' na Bekee.

Ọ mara na ị nwere ntụkwasị obi n'ụdịrị mmadụ ọ bụ, ọ ga-agba ezigbo mbọ hụ na wụghị gị n'ala.

Ọ gaghị achọ ka o meta ihe ga-emenye gị ihere maọbụ mee ka ị hụ ya ka onye abaghị uru.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, E kwesiri ime enyi tupu amalite alụmdinanwunye?