Muhammad Nami: 'Onyeisiala Buhari achụghị Tunde Fowler n'ọrụ'

Ebe foto si, Other
Onyeisiala Muhammadụ Buhari akpọọla aha Muhammad Nami dịka onye ga-abụrụzi onyeisioche Federal Inland Revenue Service ọhụrụ.
Muhammad Nami ga-anọchi anya Babatunde Fowler nke oge ya bịara na njedebe n'ụbọchị Monde.
Cheta na Onyeisiala Buhari gọrọ isi onwe ya na ọ naghị enyocha Fowler maka mpụ n'ọnwa Ọgọst afọ a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Nami ga-anọ n'ọkwa ya rue mgbe ndị ụlọomeiwu mere mkepbi maka onye ga-anọchị ọkwa ahụ kpam kpam.
ISWAP egbuola ndị agha Naịjirịa abụọ nakwa otu onye uweojii

Ihe onyonyo na-efegharị egosila etu ndị na-eyi ndụ egwu na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka bụ ISWAP si gbuo ndị agha Naịjirịa abụọ nakwa otu onye uweojii.
N'ime ihe onyonyo ahụ nke Channels TV nwetara, kọwara etu ụfodụ ndị bu egbe n'ime ya si bụrụ ndị otu ISWAP.
Akụkọ kwuru na ndị ahụ e gburu bụ ndị e si na mgbochi ụzọ adigboroja tọrọ n'obodo Benisheik dị na Maiduguri.
Ndị ahụ kwuputakwara aha ha nakwa ọkwa ha n'ụlọọrụ nchekwa ha si tupu agbagbuo ha.
Ụlọọrụ ntaakụkọ Channels kwukwara na onyeisi Lafiya Dole bụ Ado Isa gwara ha na ọ maghị maka ya bụ ihe onyonyo
O kwukwara na ọ nụbeghị maka ndị e gburu ma kwee nkwa na ọ ga-eme nchọpụta gwakwa ha n'oge adịghị anya.
Anti Doping Agency: A machiela Rọshia isonye n'asọmpi egwuregwu ọbụla

Ebe foto si, Getty Images
Otu na-ebu agha megide ịṅụ ọgwụ ike a kpọrọ Anti-Doping Agency (Wada) amachiela mba Rọshia isonye n'ụdọ egwuregwu ọbụla site ugbua ruo afọ anọ.
Ndịisi otu a mere mkpebi a n'ọgbakọ ha mere na Lausanne dị na Switzerland maka ndị na-ebu agha megide ịṅụ ọgwụ ike na Roshia achọghị inyeaka maka inyocha ndị otu ha ṅụrụ ọgwụ ike.
Nke a pụtara na a gaghị agụ abụ njirimara Rọshia maọbụ fee ọkọlọtọ ha n'asọmpi Tokyo Olympics 2020 nakwa asọmpi Iko Mbaụwa 2022 na Qatar.
Mana ndị egwuregwu e nyochara ma chọpụta na ha dị ọcha ga-esonye n'asọmpi dịka ndị kwụrụ onwe ha.
Nwata nwoke kpọrọ enyi ya nwaanyị ọkụ

Ebe foto si, Traffic Butter
Alabi Tolani Mariam bụ nwata nwaanyị dị naanị afọ iri abụọ na anọ, anwụọla ka enyi ya nwoke mụnyere ya ọkụ na Legọs.
Enyi ya nwoke bụ Ifeanyichukwu Victor dị afọ iri na itoolu, gwara ndị uweojii na ọ kpọrọ ya ọkụ mgbe ọ chọpụtara mmekọrịta ya na nwoke ọzọ.
Amachiela ahịa mbugharị n'Arịarịa

Ebe foto si, @okezieikpeazu
Gọvanọ Okezie Ikpeazụ nke Abia Steeti amachiela ahịa mbugharị n'akụkụ ahịa Arịarịa dị n'Aba iji belata unyi na ihe ndị ọzọ.
Ọnụ na-ekwuchitere gọọmentị steeti ahụ bụ Onyebuchi Ememanka, sị na gọvanọ nyere iwu ka ndị a baa n'ime ahịa gaa chọrọ ụlọahịa karịa ibugharị ahịa.
N'ofesi

Ebe foto si, Getty Images
Ọ dịzịkwa ka ụmụnwaanyị anaghịzi achị n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị ugbua dịka nwaada Sanna Marin dị afọ iri atọ na asatọ ga-abụ praịm mịnịsta kachasị pee mpe n'afọ na mba Finland.
Ọ ga-abụ onye ndu pati ise ekpokọtara ọnụ nke ndịisi ha bụcha ụmụnwaanyị.
N'egwuregwu

Ebe foto si, PA
Ajụjụ dị ndị mmadụ n'ọnụ ugbua bụ ma Leicester City ọ ga-achụkwutenwu Liverpool n'ogogo tebulu Premier League?
Nke a bụ makana Liverpool bụ ndị mbụ, ji akara ise karịa ndị Leicester bụ ndị abụọ n'agbanyeghi na ụzọ ka dị anya.
Nkeji
Lee nwaanyị kachasị mma n'ihu eluigwe

Ebe foto si, Getty Images
Nwafọ mba Saụt Afrịka bụ Zozibini Tunzi eturula ugo dịka nwada kachasị mma n'ihu eluigwe na ụwa a kpọrọ 'Miss Universe' nke afọ 2019.
O mere nke a mgbe o gosiri ndị ọkaikpe na ihe ọ na-eme doro ya naya nke ọma site n'ịga ije nganga nakwa ịza ajụjụ ndị na-eso ya.
Mgbe a jụrụ ajụjụ maka ụmụaka ụmụnwaanyị, Tunzi sị na ihe kachasị mkpa ha kwesịrị ị mụta bụ etu e si abụ onye ndu.
Ndị na-eso ya n'azụ bụ Madison Anderson si mba Puerto Rico na Sofia Aragon nke mba Mexico.
Nwada a nwetere mmeri a n'emume nke ugboro iri isii na asatọ e mere ụnyaahụ n'Atlanta Georgia dị na mba Amerịka.
DSS nyụrụ nsị n'ụlọụka

Ebe foto si, Sowore2019/Facebook
Ọkaiwu Omoyele Sowore bụ Femi Falana sị na ndị nchekwa DSS ma na ha nyụrụ nsị n'ụlọụka maka nwakpo a sị ha wakporo Sowore n'ụlọikpe nke mere ha ji rịọ ọkaikpe Ijeoma Ojukwu arịrịọ.
Nke a dị n'ozi o wepụtara na Sọnde iji katọọ okwu ndị DSS kwuru na ọ bụghị ha wakporo ụlọikpe n'ụbọchị Fraịde.
Ọ sị na ozi a DSS wepụtara bụ ịtụgide onwe ha asị n'isi nakwa ị gọnarị agwa ọjọọ ndị ọrụ kpara n'ụlọikpe ukwu dị nAbuja.
Mana ọnụ na-ekwuru DSS bụ Peter Afunnaya sị na onweghi mgbe ha wakporo ụlọikpe, na ọ bụ n'ezi ka nwụchiri Sowore.
Cardi B etinye esemokwu n'etiti Naịjirịa na Ghana

Ebe foto si, RAYMOND HALL
Ndị Gana na ndị Naịjirịa na-adọri onwe ha na soshal midia maka njem nwada mba Amerịka na-eti egwu bụ Cardi B mere na mba ndị a.
Ndị Gana na-ewe iwe na Cardi B emeghi ha nke ọma dịka o si mee ndị Naịjirịa maka na ọ pụtaghị ka ya ndị a ma ama ha nwee mkparịtaụka.
Ha sị na ọtụtụ ndị na-eti egwu a ma ama na Ghana pụtara n'igwe na-eche Cardi B mana ọ pụtaghị.
Mana Cardi B sị na afọ na-asa ya n'ihi nri o riri na ọ bụ ya mere ọ pụtaghị ka ya na kparịtaụka.
N'ofesi

Ebe foto si, BCC
Ndị uweojii sị na ha na-achọ ọtụtụ mmadụ achọ na mba New Zealand ebe mgbawa ugwu a kpọrọ Volcanic eruption mere.
Akụkọ kwuru na a hụrụ ndị njem nlegharịanya ka na-aba n'ogige ugwu ahụ tupu mgbawa ugwu a emee.
Nkeji
Ihe nkiri












