Boko Haram egbuola onye ọrụ enyemaka

Boko Haram fighters

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Boko Haram kwuru na nkwuzi bekee bu arụ

Otu ngalaba Boko Haram a kpọrọ 'Islamic State West Africa Province' egbuola otu onye ọrụ enyemaka ha tọọrọ.

N'ozi otu a kpọrọ 'International charity Action Against Hunger' wepụtara kwuru na onye a e gburu so n'ime mmadụ isii ndị Boko Haram tọọrọ n'ọnwa Julaị 2019.

A matabeghi aha onye ọrụ enyemaka ahụ e gburu ma ọ bụ kwanụ onye ọrụ ndị otu 'Action Against Hunger' n'ezie.

N'ọnwa Julaị, a tọọrọ otu onye ọrụ nlekọta, ndị ọkwọụgbọala abụọ na ndị ọrụ mịnịstrị ahụike mmadụ atọ na Borno Steeti.

Ogbugbu a na-abịa n'ime otu izuụka ndịagha mechiri otu ụlọọrụ nlekọta dị na Maiduguri ma kwuo na ha na ndị Boko Haram na-arụkọ.

Ụlọọrụ a kpọrọ Mercy Corps kwuru n'ụbọchị Wednezde na ndịagha Naịjirịa mechiri ụlọọrụ ha nke mere ha agaghị arụ ọrụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: