Exhumed Corpses: Ihe mere e ji bọlie ozu abụọ na Njaba, Imo state

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Nsogbu adaalara ozu abụọ na Njaba

Ebe a na-eli ozu

Ebe foto si, AFP/Getty Images

Ụmụ ntoroọbịa eburula ozu mmadụ abụọ abọpụtara maka ịzọ ala bụba n'ụlọ ndị bọrọ ya.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Ikokwu Orlando kwuru na ozu abụọ ndị ahụ nọ na ọba ọzụ dịka ndị obodo na-etinye ọnụ na ya bụ okwu.

Orlando gwara BBC na ala ebe eliri mmadụ abụọ ahụ nọ na ndọrọndọrọ tupu e lie ndị ahụ,

Ọ sị na dịka ndị obodo na-etinye ọnụ maka ikpezi ya bụ okwu, na dị uweojii kere nkwụcha ị hụ na ọgbaghara agaghị adapụta.

O kwukwara na ya bụ okwu abụghị nke ndị uweojii ga-etinye ọnụ ka ọ dị ugbua.

Osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo chọrọ ịkpọpụ ndị mmadụ n'ụlọikpe.

Osinbajo

Ebe foto si, Getty Images

Osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo ewela iwu ma kwuo na ndị mmadụ na-emetọ aha ya.

N'ozi o wepụtara n'akara twitter ya, o kwuru na ụfọdụ ndị mmadụ na-ebu akụkọ ụgha megide ya.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

O kwuru na akụkọ ụgha a agbasala na soshal midia niile.

Osinbajo sị na ọ ga-ewepu ikike ya dịka onyeisiala iji buso ndị na-emetọ aha ya agha.

Ọ sị na o nyela ndị ọkaiwu ya ikike ka ha malite njem ịkpụpụ ndị a n'ụlọikpe.

Egbuola otu onye ọrụ enyemaka na Borno

Boko Haram fighters

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Boko Haram kwuru na nkwuzi bekee bu arụ

Otu ngalaba Boko Haram a kpọrọ 'Islamic State West Africa Province' egbuola otu onye ọrụ enyemaka ha tọọrọ.

Otu International charity Action Against Hunger' sị na onye a e gburu so n'ime mmadụ isii ndị Boko Haram tọọrọ n'ọnwa Julaị 2019.

Ama agbaala n'isi Trump

Donald Trump

Ebe foto si, Getty Images

N'ofesi, eziokwu apụtala ihe ebe ụbụbọ dị n'etiti onyeisiala Trump na nke mba Ukrain bụ Volodymyr Zelensky maka inyocha Joe Biden.

Ya bụ ụbụbọ ha kpara na ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Julaị n'ekwentị bụ nke ahụtaburu dịka asịrị apụtala ihe ugbua.

Iko CARABOA ebirila ọkụ

CARABAO

Ebe foto si, Getty Images

N'egwuregwu e, Otu egwuregwu na mba Inglandị ga apiri ya na asọmpi iko CRABOA n'abali a.

Manchester United na Rochdale, Chelsea na Grimsby, MK Dons and Liverpool, Brighton and Aston Villa so na ndị ga-ezute na mgbede a.

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Nwoke a saala asịsa

Ndị uweojii Pọtakọt

Ebe foto si, NIGERIA POLICE

kọmishọna ndị uweojii na Rivas Steeti bụ Mustapha Dandaura gwara ndị ntaakụkọ na nwoke eboro ebubo igbu ụmụnwaanyi ise ekwugharịala ma sị na ọ bụ ụmụnwaanyị iteghete ka o gburu na

Pọtakọt.

Dandaura kwuru na ọ bụ ụlọ ọrịri nke ikpeazụ nwoke ahu gara ka ha setere ya n'ihe onyonyo CCTV ma nwete kwa akara ekwenti ya.

O kwuru na ọ bụ ihe ndi a mere e ji jide ya n'ime ụgbọala na-aga Akwa Ibom.

O kwukwara na nwoke a kwuziri ugbua na ọ gburu otu nwaanyị na Owerre, Sapele, Aba, Benin na Ibadan ma gbuo iteghite na Pọtakọt.

Dandaura sị na "nke a mere ya iri na ise mere ụnyaahụ dịka ndị uweojii nyocha abụọ si Aba gosiri anyị foto nwaanyị ekechiri aka na ukwu ma tọgbọ n'ụlọ oriri. Ihe onyonyo ha gosiri zipụtakwara nwoke a" .

O gwakwara ndị ngalaba ndị nchekwa ehibere iji hu na ụlọ oriri niile tinyere ihe onyonyo CCTV na ihe ndi ọzọ maka nchekwa n'ogige ha ka ha jisie ike n'ọrụ.

Mgbe ndi uweojii mechara nyocha ha, ha ga-akpọpu ya ụlo ikpe.

Ọ bụ ụlọikpe ga-ekwu ma ikpe a mara nwoke a.

Keyamo
Nkọwa foto, Fetus Keyamo bụ ọkaiwu nwere agba

Ebugharịala ọnọdụ Festus Keyamo dịka Minista na-ahụ maka ihe gbasara Naija Delta were mee ya Minista na-ahu maka ọrụ na inweta ọrụ.

Keyamo ga-anọchị Tayo Alasoadura ebe Alasoadura ga-anọchi Keyamo dịka Minista Naija Delta.

UNGA

Onyeisiala Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Buhari kwuru maka ilusa nr uru aka ọgụ

Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuola na ikpe ndị P&ID na-ekpe megide Naịjirịa bụ nrụnrụaka ha chọrọ iji napu Naijirịa ijeri Naira.

Buharị kwuru nkea n'ọgbakọ ndị UN na Newyork ma kwuo na gọọmentị Naijirịa na-agba mbo imegide nrụrụaka.

N'Ofesi

Trump na Pelossi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Trump kwuru na ebubo eboro ya enweghị isi

Ndị otu ọchichi nke Democrats na mba Amerika ebidola atumatu iji wepu Donald Trump dika onyeisiala Amerika maka ebubo iji mba Ukraine gba onye na-azọsa ya ọchịchị bụ Joe Biden mgba okpuru.

Nancy Pelosi onyeisi ndị otu democrats kwuputara nke a kama Trump akpọghị ya ihe.

Lionel Messi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Messi bụ onye ndụ ndi Barcelona

Mmerụahụ anapụla Lionel Messi nke Barcelona ohere i so gbachaa asọmpị ebe ha meriri otu boolu Villarel na Tuzde.

Ndi otu Barce na-atuanya na mgbe na-adịghi anya Messi ga-abatakwa n'egwu ma mewe ihe eji mara ya.

Gụọ akụko ga-amasị gị -

Gee Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkịri a

Aha onyonyo, Idemmiri achụpụla ndị Ogbarụ, Anambra Steeti n'ụlọ ha.