Okezie Ikpeazu o ji ndị ọrụ gọọmentị Abia state ụgwọ akwụ akwụ?

Okezie Ikpeazu were oche ọchịchị Abia Steeti n'afọ 2015

Ebe foto si, @okezieikpeazu

Nkọwa foto, Okezie Ikpeazu were oche ọchịchị Abia Steeti n'afọ 2015

N'ọnwa Mee nke afọ 2019 ka akuko pụtara na-eji ndị nkuzi Sekọndịrị na Praịmarị ụgwọ ọnwa n'Abịa steeti, nke mere ha jiri gbaa abụbụ ọrụ.

Mana, ka a ka na-ekwu maka ha, akụkọ na-apụta ebe niile na ụgwọ a eji zuru ọtụtụ ngalaba gọọmentị ahụ.

BBC jụrụ ụfọdụ ndị ọrụ Abia steeti ka ha gwa anyị ihe mere ede jiri bee nwii.

Ndị Nkụzi Sekọndrị

Ụmụakwụkwọ na-akuzi onwe ha

Ebe foto si, AFP

Otu onye nkụzi Sekondrị nke dị n'Aba kwuru na ha anatabeghị ụgwọ ọnwa kemgbe Jenuarị 2019.

Ọ choghi ka akpọọ aha ya.

Ndị Ezumike nka

Ndị ezumike nka

Ebe foto si, Handout from HelpAge International

Anyị kpọrọ otu onye ọrụ nke Abia steeti lara ezumike nka ka ọ kọrọ anyi ije ha na gọọmenti Abia steeti n'ịkwụ ha ụgwọ ọnwa.

O kweghị ka anyị kpọọ aha ya .

Kama ọ gwara anyị na ndị dị ka ya rụrụ ọrụ na 'Primary School' anatabeghi ụgwọ ezumike nka ha kemgbe ọnwa Aprel 2018.

Ebe ndi nke 'Secondary School' nke nọ n'ọkpụrụ steeti anatabeghị ụgwọ ezumike nka ha Kemgbe ọnwa Nọvemba 2017.

Ọ mekwara ka anyị ghọta na ụgwọ ọnwa opekatampe nke 2017 ekwesiri ịkwụ ha n'atụmatụ 'Harmonization' gọọmentị wepụtara esoghị n'ụgwo a na-akwụ ha.

Ndị ọrụ ụlọọgwụ ABSUTH

Dibia bekee

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Dibia bekee

Onye ụlọọrụ ABSUTH gwara BBC na site n'ọnwa Ọgọstụ 2018 ma ruo ọnwa Sepụtemba 2019 na ọ bụ otu ugboro ka a kwụru ha ụgwọ ọnwa.

O kwukwara na ụgwo ọnwa a bụ nke Julaị 2018 na ha natara ya n'ọnwa Ọgọstụ 2019.

O kwuru na dịka o si dị, na Gọvano Abia Steeti bụ Okezie Victor Ikpeazu achọghi ima na eji ha ụgwọ.

Ọ gwakwara BBC na mgbe ha gbara abụbụ ọrụ, na ọ bu arịrịọ onyeisi ha bụ Mazi Offia mere ka ha ji kwụsị ịgba abụbụ ọrụ.

Ọnye ụlo ọrụ ABSUTH a achọghi ka akpọo aha ya.

N'aka nke ọzọ,

Aha onyonyo, Anyị akwụchala ndị ọrụ ụgwọ ha - Okezie Ikpeazu

Ọnye odeakwụkwọ mgbasa ozi gọvanọ Okezie Ikpeazụ bụ Onyebuchi Ememanka, kọwara na ọ bụghị gọọmentị steeti ka ọ dị n'aka ịkwụ ndịọrụ ABSUTH ụgwọọnwa.

Ememanka kwuru na ABSUTH bụ ụlọọgwụ fọrọ obere ka ha kwụrụ onwe ha.

Ọ kọwara sị: "Gọọmentị na-enye ha obere ego kwa ọnwa ka ha tinye n'ego nke ha na-enweta iji wee kwụọ ụgwọọnwa."

"Ọ bụ eziokwu na e ji ndị dọkịta ụgwọ mana amaghị m ọnwa ole e ji ha."

"Gọvanọ ahọpụtala onyeisi ọhụrụ maka ụlọọgwụ ahụ."

"Anyị na-eleba anya n'ụzọ a ga-esi mee ka ihe niile a bie."

Ememanka rịorọ ndị dọkịta ABSUTH ka ha ghara ịgba abụbụ ọrụ ọzọ.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere tupu emee ntiliaka nke 2019 Gọvanọ Ikpeazu kwuru na onweghị ụgwo ya ji.

Ọ bụzị anya ga-amara ma ihe ntị nụrụ ọ bụ eziokwu.

Akụko ga-amasi g