Akụkọ Mere Ugbua: Ndị nkuzi Abịa alaghachila ọrụ

Ebe foto si, AFP
Ndị nkuzi ụlọakwụkwọ Praịmarị na Sekọndịrị nke Abia Steeti gbara abụbụọrụ n'ihi akwụghị ụgwọ ọnwa ga-alachi ọrụ.
Ndị nkuzi praịmarị sị ka akwụghị ha ụgwọ a kpọrọ 'Teacher Salary Subsidy' ebe ndị nke sekọndịrị na-achọ ụgwọ ọnwa iri e ji ha n'ụgwọ.
Otu onye ngalaba n'ahu maka ndi nkuzi na steeti ahụ achọghị ka ekwu aha ya gwara BBC Igbo na ha nọ nzukọ maka ọnọdụ a.
Ekwentị Ode Akwụkwọ Mgbasaozi Abịa steeti bụ Onyebuchi Ememanka agaghị mgbe BBC Igbo kpọrọ ya.
Akụkọ ka na-abịa.





