Abịa State University Teaching Hospịtal: 'Ọrụ akwụghị ụgwọ ndịọrụ na ABSUTH eruola ọnwa 13'

Ebe foto si, Getty Images
Ọrụ dibịa bekee so n'otu ọrụ kacha e nye ugwu n'ụwa niile.
A na-akpachapụrụ ndị dibia bekee anya nke ọma n'ihi na ọrụ ha dị oke mkpa n'obodo ọbụla.
Mana ndị dibia bekee na-arụ n'ụlọọgwụ Mahadum Abịa Steeti (Abia State University Teaching Hospital) azaala 'Nkemdiche'.
Mana 'Nkemdiche' bụkwa ajọ aha dịka Igbo si atụ n'ilu.
Kamgbe ọnwa iri na atọ gara aga, ndị dọkịta ABSUTH nakwa ndị ọrụ niile na-arụ n'ụlọọgwụ ahụ amaghị ihe a na-akpọ ụgwọ ọnwa dịka ha si kwuo.
Ha emeela ngagharịiwe, onweghi isi, gbaa abụbụ ọrụ, onweghi isi, ha nọzi ka nwa atụrụ na-enweghị onye nche.
Nnamdi Irondu gwara BBC Igbo na ha na-ata nnukwu ahụhụ n'ihi akwụghị ụgwọ ọnwa ha.
Irondu bụ onye mgbasa ozi otu ndị dibia bekee na ABSUTH a kpọrọ 'Association of Resident Doctors'.
O kwuru na ọ bụ sọ Chukwu ma otu ha si adị ndụ kwa ụbọchị ma nwee ike ka na-arụ ọrụ.
N'okwu ya: "Ihe jọọrọ anyị nnukwu njọ ugbua maka na ọtụtụ n'ime anyị anaghị enwe ike pịkọọ etu ha ga-esi ebi ndụ n'ihi na onweghi onye ma mgbe ego ga-abata ya aka."
O kwuru na ọ bụ ihe di otu a mere ọtụtụ ndị dọkịta ndị ntorobịa ji ahapụ Naịjiria gbalaa mba ọzọ ebe e ji ndị dọkịta kpọrọ ihe.
Gini kpatara oke iji ụgwọ a?
Irondu kwuru na gọọmentị ma ụma eji ha ụgwọ n'ihi na ha ma na onweghị ihe ha nwere ike ime.
"Anyị gbara abụbụ ọrụ n'ọnwa Nọvemba afọ gara aga, nọgide ya ruo ọnwa Jun afọ, onweghi onye tụpụụrụ anyị ọnụ."
"Anyi mechaa lọghachikwa ka ụlọọgwụ a ghara ịnwụ kpam kpam."
Mana onye odeakwụkwọ mgbasa ozi gọvanọ Okezie Ikpeazụ bụ Onyebuchi Ememanka, kọwara na ọ bụghị gọọmentị steeti ka ọ dị n'aka ịkwụ ndịọrụ ABSUTH ụgwọọnwa.
Ememanka kwuru na ABSUTH bụ ụlọọgwụ fọrọ obere ka ha kwụrụ onwe ha.
Ọ kọwara sị: "Gọọmentị na-enye ha obere ego kwa ọnwa ka ha tinye n'ego nke ha na-enweta iji wee kwụọ ụgwọọnwa."
"Ọ bụ eziokwu na e ji ndị dọkịta ụgwọ mana amaghị m ọnwa ole e ji ha."
"Gọvanọ ahọpụtala onyeisi ọhụrụ maka ụlọọgwụ ahụ."
"Anyị na-eleba anya n'ụzọ a ga-esi mee ka ihe niile a bie."
Ememanka rịorọ ndị dọkịta ABSUTH ka ha ghara ịgba abụbụ ọrụ ọzọ.
Nke a abụghị nke mbụ okwu iji ụgwọ ọnwa na-abolite n'Abịa Steeti.
Ndị nkụzi na steeti ahụ agbabuola abụbụ ọrụ n'ihi na gọọmentị ji ha ụgwọ ọnwa iri ma mechaa kwụọ naanị abụọ.
Ndị ọrụ 'Abia Poly' chọkwara ịfanye aka n'ụkwụ n'ihi na gọọmentị chụrụ ọtụtụ ndị otu ha n'ọrụ n'agbanyeghi na e ji ha ụgwọ ọtụtụ ọnwa.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:











