Minimum Wage: 'Anyi eriwela N30,000 ụgwọ opekata mpe' - Ndị ọrụ Gọọmentị.

Ebe foto si, Getty Images
Dịka Minista na-ahu maka ọrụ na nrụpụta bụ Chris Ngige na-ekwu na-ebidola ịkwụ ụgwọ opekata mpe Gọọmentị hibere, ụfọdụ ndị ọrụ Gọomentị na-ekwu na ọbụghi eziokwu ebe ụfọdu na aṅụrị na ha eriwele elele a.
Tony Ozurumba bụ onyeisioche ndị 'Joint Health Sector' nke ụlọọgwụ na-ahụ maka ndị ọrịa isimgbaka ( Federal Neurophsychiatric) dị n'Enugwu steeti kwuru na ha anatabeghị ụgwọ opeketempe a.
N'aka nke ọzọ, otu onye ọrụ gọọmenti na-arụ n'Abuja na achọghị ka akpo aha ya kwuru na ha natara ya bụ ụgwọọnwa opekata mpe n'ọnwa Ọgụstu.
Cheta na-ebulịrị ụgwọ ọnwa a site na puku naira iri na asatọ n'afọ 2018 were bulite ya ruo puku naira iri atọ n'afọ 2019.
BBC kpọrọ Minista Chris Ngige na-ahụ maka ndị ọrụ Naịjirịa ka ọ kọwara anyị ihe mere na ụfọdụ ndị nwetere ụgwọ a ebe ụfọdụ enweteghị.
Onye na-ahụ maka mgbasa ozi nke Minista a bụ Nwachukwu Obidiwe, kwuru na ya na Minista Chris Ngige akpabeghị maka ndapụta a.
Obidiwe si na Minista Ngige gara ala Igbo kemgbe Tụzde ma si na ha abụọ enwebeghị mkparịta ụka kemgbe ọ lọtara.
Kama ọ kwuru na Minista ga-aza ajụjụ a na mgbede.
Anyị ka ga-ewetere ụnụ akụkọ a n'uju.









