Abia steeti ewetaala ụzọ ahụike ọgbara ọhụrụ

Ebe foto si, Abia Government/Facebook
Gọọmenti Abia steeti akwenyela ka e bido ụzọ ọhụrụ iji nye ahụike na steeti ahụ nke a kpọrọ "telemedicine" na bekee.
Telemedicine bụ atụmatụ ọhụrụ ebe dọkịnta na ndị ọrịa nwere ike ịkparịtaụka site n'ekwentị ọkachasị n'oge ihe mberede.
A na-ele anya n'ụzọ a ga-enye aka ịzọ ọtụtụ ndị mmadụ ndụ n'ọge mberede
Dịka ndị ọrụ ahụike kọị̀ara ya, ha kwuru na telemedicine bụ ezi ụzọ onye dọkịnta na ọnye ọ na-eleta nwere ike ịkpakọrịta nkeọma.
Dọkịnta ahụ na ọnye ọ na-eleta ga-eji ekwentị amapụtara wee na-akparịta ụka ee ekwentị ahụ na-aga n'isi ebe ndị dọkịnta ọpụrụiche nọ. E kwuru n'ụzọ a na-aga nkeọma na mba ofesi.
Oge a kọwachara Ikpeazu etu o si arụ ọrụ, ọ nwalekwara ya ma kwee n'isi na ọ gara nkeọma tụpụ o weliere ya aka elu ịụ̀a n'ihu.
Onye na-ahụ maka ọrụ a bụ Dọkịnta Omas Ubaime gwara Ikpeazụ na Abịa steeti bụ steeti mbụ ebe a na-anwale igwe na Naịjirịa niile.
Ubaime kwuru na ha tụrụ anya inweta oku mmadụ puku abụọ mana ha nwetara mmadụ puku itoolu ndị ọrịa nek gosiri na ịhe nchọpụta a ga-aga nkeọma.
Ọ kọwara na ha ga-enye ndị mmadụ kaadị pụrụiche ga-ebu akara piini a ga-ere n'ọnụegọ narị ise. Kaadị ka oney ọịa ga-eji kpọọ ma nye onye dọkịnta piini ya.
Ubaime kwuru na ha na ndị ụlọọgwụ ndị na-ahụ maka ahụike ga-arụkọ ọrụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










