Ụlọomeiwu Abia akwụsịla Jọstis Uzokwe,ọkaikpe steeti ahụ ọrụ n'ike

Justice Theresa Uzokwe na Theodore Orji n'afọ 2012

Ebe foto si, Abiastategov

Nkọwa foto, Onye Govanọ chịrị Abịa n'oge gara aga, bụ Theodore Orji tinyere Uzokwe n'okwa oka-ikpe n'Abia Steeti

Ndị omebeiwu Abia Steeti ekwuola na ihe mere ha jiri kwụsị onye okaikpe Jọstis Theresa Ụzọkwe n'Abịa steeti ọrụ n'ike gunyere ebubo aka ike, imefu ego na ọgụ na mgba megide Chief Registra, na ndị okaikpe ndị ọzọ.

Na nzukọ mberede nke ha mere n'ụbọchị ọnwa Jenụwarị gbara ịrị abụọ na ise, ndị ụlọ omeiwu Abia Steeti kwụsịrị oka-ikpe steeti ahụ, bụ Justice Uzokwe ọrụ n'ike, ebe ha gwara Govanọ ka o tinye onye ọzọ. n'ọkwa rue mgbe kọmiti na-ewepụtara inyocha ebubo e boro Justice Uzokwe enwe mkpebi okwu.

Ka ọ dị ugbua, Gọvanọ eduola Jọstis Obisike Orji iyi ọrụ dịka onye ga-na arụ ọrụ ka okaikpe nke steeti.

Obisike Orji bụ ọkaikpe ọzọ kacha n'ọkwa na Mịnịstrị na-ahụ maka ikpe n'Abia Steeti.

Ebubo eboro ya

Osote onye isi ụlọ omeiwu nke Abia Steeti bụ Cosmos Ndukwe gwara BBC na ha natara akwụkwọ mkpesa sitere n'aka ọtụ abụghị nke gọọment akpọrọ,"Global Peace Initiative ," nke bụ otu ndị oka-ikpe nọ na steetị ahụ.

"O nwere akwụkwọ ndebeta a detara anyị na ụlọ ọmeiwu. Ha dere otu o si na-akparị ndị jokaikpe ibe ya, otu o siri mee ka ọchịchị onye oka-ikpe dịka ọchịchị onye na-azụ ahia n'ime ahịa."

O kwuru na ụlọ omeiwu ahụ gbadoro ụkwụ na Section 296 nke iwu ala anyị nke nyere ụlọ omeiwu nke steeti ikike iwepu okaikpe mere ihe ekwesịghị ọkpụkpọ ya.

Ọ gara n'ihu kwue na ha ewepụtala kọmịiti ga-elebanye anya n'ebubo ndị ahụ ma nye Justice Uzokwe ohere ị zara ọnụ ya.

Cheta na ọ bụ onye Govanọ chịrị Abịa Steeti n'oge gara aga, bụ Theodore Orji tinyere Justice Uzokwe na'ọkwa dịka ọkaikpe Abia Steeti n'onwa December dị ịrị abụọ na abụọ.

Akụkọ a ka na-abịa n'uju.