Ghana si na ha anwụchiela ndị chọrọ ichutu Onyeisiala Akufo-Addo n'ọkwa

Ebe foto si, Getty Images
Ndị ọrụ nchekwa na Ghana akọọla etu ha sị gbochie ndị ha si chọrọ ịnapụ ikike n'aka na-achi mba ahụ bụ Nana Akufo-Addo.
Ndị ọrụ nchekwa a banyere ọrụ n'ọnụ ụtụtụ ụbọchị Fraịde gara aga ma nwụchịkọ ndi a ha na-enyo bụ ndị ha sị na ha na-akpa nkata ịchụtu onyeisiala Ghana ma nọchịe anya ya.
Dịka akwụkwọ mgbasaozi ụlọ ọrụ Mgbasa Ozi wepụtara kwuru, ndị ọrụ nchekwa rụrụ ọrụ ha nke gunyere ime nyocha ma chopụta nke bụ eziokwu tupu amalite nwụchịkọ ndị a.
"Njem a ndị ọrụ nchekwa di iche iche tinyere aka na ya pịnyụrụ, nkata akpara iji chupu onyeisiala, bụ nke kaara itinye mba Ghana na ọgbaghara. "
Ọ bụ Maazị Kojo Oppong Nkrumah binyere aka n'akwukwọ mgbasaozi a.
Ndị a aka ji bụ Dọkịnta Frederick Yao Mac-Palm, onye ọkpụ egbe aha ya bụ Ezor Kafui na Bright Allan Debrah Ofosu.
Ụlọ ọrụ mgbasaozi sị "n'etiti ọnwa Juun na Ọgọọst nke afọ 2018, BB, bụ onye na-agara Dọkinta Mac-Palm ozi, gakwuru ụfọdụ ndị ọrụ nchekwa ka ha soro kpa nkata ichutu gọọment were ọnọdụ."

Ebe foto si, Twitter/Serwaa Amihere
E kwuru na ndị a mere nzukọ na nuzo na ebe akpọrọ Next Door Beach ma nwaa akụrụmgwa ha chọrọ iji mezuo ebumnuche ha na gburugburu Laboma Beach.
Ngwaagha a ndi ọrụ nchekwa natara ha gunyere egbe nkenke akpụrakpụ na ọbọ mgbo ya, egbe nke emere n'ofesi na ọbọ mgbo abụọ, ihe na akwụ anụrụ ọkụ atọ nakwa mma.
Ka akụkọ na foto ndị kpara nkata nakwa akụrụmgwa ha ruru soshal midia, ụfọdụ mmadu malitere ịjụ ma gọọment okwukwara nke bụ eziokwu maka nkata a ha si na ndị a kpara.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

End of X post, 2
Ndi ọzọ na-aju maka akụrụmgwa ndị egosiri o zuru ibuso ndị agha Ghana agha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3