Omoyele Sowore: Ụlọikpe sị ka a tọhapụ ya

Omoyele Sowore bụ onye ndu pati African Action Congress

Ebe foto si, Sowore2019/Facebook

Nkọwa foto, Ngagharịiwe 'RevolutionNow' ka a na-atụ anya ịmalite n'ụbọchị ise nke ọnwa Ọgọstụ 2019

Ụlọikpe n'Abuja sị ka atọhapụ Omoyele Sowore bụ onye nwe ulọọrụ ntaakụkọ Sahara Reporters.

Na mkpebi o mere n'Abuja taa, ụlọikpe sị na gọọmentị wepụrụ akwụkwọ ha tinyere iji rịọ ka adọọtịe ọnọdụ Sowore n'aka ha.

Nke mere na ha enweghi ikike ijide ya gafee ụbọchị 45 iwu nyere.

Agbanyeghị na ụlọikpe si ka Sowore lawa, o kwukwara na o ga-ahanye akwụkwọ o ji eme ọpụpụ na mbata bu nke Bekee kpọrọ "passport" n'aka gọọment.

Ọ sịkwa na Ọkaiwu ya bụ Femi Falana ga-akpọtarịri ya mgbe ọbula ụlọikpe chọro ya.

Ụlọikpe mba Briten agbaghala Boris okwu

Úlóikpe mba Briten

Ebe foto si, European Photopress Agency

Ụlọikpe ukwu na mba Briten akagbuola atụmatụ Boris Johnson imechinata ụlọomeiwu mba ahụ nwamgbe nta maka na ọ dịghị n'iwu.

Johnson mechinatara ụlọomeiwu mba Briten izuụka ise ka Eze nwaanyị mba bụ Queen Elizabeth nwee ike kwado agụmaagụ ya maka ihe ọ chọro ime n'ọdị n'ihu.

Mana ụlọikpe jụru kwiki na ya bụ amụma adịghị na iwu, ịkwụsị ndị omeiwu ọrụ ha.

Ọkaikpe ụlọikpe ahụ bụ Lady Hale sị na " ajọ ihe ọ ga-ebutere obodo ahụ karịrị akarị".

Ndị ọrụ egwujiela mbazụ n'Abịa Poly

Abia Poly

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndi uweojii nọchiri ụzọ n'Abia Poly

Abia steeti Polytechnic Aba ewunrula ọkụ ọzọ ebe ndị ọrụ na-etimkpu na akwụbeghị ha ụgwọ ọnwa kemgbe ọnwa iri na isii.

Nke ka njọ bụ na ndị isiọrụ sị na ha nwa anwa gba abụbụ ọrụ, achụọ ha n'ọrụ, dịka onyeisi otu ndị ọrụ bụ Nwachukwu Chukwu si kwa BBC Igbo.

Otu ndị ọrụ a boro onyeisi ya bụ ụlọakwụkwọ bụ Eboh Eboh ọtụtụ ebubo nke gụnyere ịkụpịa ego ya bụ ụlọakwụkwọ n'ụzọ na-akwụghị ọtọ.

Ha bokwara Eboh na o riri ego isusu ndị ọrụ nke ruru nde narị Naịra abụọ am birikwa n'ụlọ oriri na nkwari kemgbe 2017 akpọrọ ya na ya bụ ọrụ.

BBC kpọkwara Mazi Eboh ka ọ zara ọnụ ya n'ebubo ndị a mana ọ zaghị ekwentị ya.

Nchekwa adịghị n'Abuja

Ónú ózó Abuja

Ebe foto si, AFP/Getty Images

Ndị ọkachamara na ọrụ nchekwa agwala onyeisi ndị uwe ojii bụ Mohammed Adamu ka o wepụ aka n'ụbọ na ụbọ ga-ebutere ya ọrịa.

Ndị otu a ekweghị n'ihe Adamu kwuru na nchekwa dị n'Abuja dịka o si tuo n'ọnụ.

Ndị otu a gụpụtachara ihe ọjọọ niile mere n'Abuja nso nso a dika ntọ, ohi na arụ ndị ọzọ dịka ihe gosiri na nchekwa adịghị n'Abuja dịka Adamu turu n'ọnụ.

Mba UK, France na Germany eisiela ọnwụ na Iran nyụrụ ihe na-esi

Ndíisi UK

Ebe foto si, AFP

N'ofesi, Iran etiela mkpu, gọọ maka ebubo mba Germany, France na UK na-ebo ha maka ịtu ogbunigwe na ebe a na-emepụta mmanụ agbidi na Saụdi Arabia.

Agbanyeghị na ndị ọchọngaloko Houthi ejirila ya bụ arụrụala nyaa isi, mba ndị a ka na-ekwusi ike na ọ bụ Iran tụrụ ya.

A ga-amachi Rushịa n'egwuregwu mbaụwa?

Mba Róshía

Ebe foto si, Getty Images

Enwere ike ịmachi mba Russia n'egwuregwu mbaụwa ma ọ bụrụ na ha akọwataghị muchi muchi dị n'akwụkwọ nkọwa ha degara ndị World Anti Doping Agency.

Ndị otu a nyere Russia izu atọ iji kọwa nkagbu enwere na ya bụ akwụkwọ nkọwa maka ebubo ịkpacha anya nye ndị nnọchite anya ha ọgwụike.

Gee akụkọ ndị a na Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri ebe a

Aha onyonyo, Ihe mere m ejighi nwee TV na be m - Cosmas Maduka

Akụkọ ga-amasị gị