Jim Nwobodo: Umahi hapụrụ PDP banye APC, ọ bụ APC ga-enye ndị Igbo ọkwa onyeisiala?

Jim Nwobodo na Dave Umahi
Nkọwa foto, Jim Nwobodo na Dave Umahi
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 9

Aka chịburu Enugwu steeti bụ Jim Nwobodo ekwuola na ọpụpụ gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi pụrụ na pati ya bụ 'Peoples Democratic Party' gaba APC agaghị achịtara ya aja.

Nwobodo kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo n'ụbọchị Fraịde.

O kwuru na ọ bụ ihe "gbara m nnọọ gharịị"na Umahi ga-esi na PDP pụọ ugbua o doro ewu na ọkụkọ anya na ọ bụ ndị Igbo ka o ruru inweta ọkwa onyeisiala.

Ọ gara n'ihu kwuo na dịka onyeisi otu ndị Gọvanọ nke mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, ọ bụ Umahi kwesịrị iso na ndị ga-agba mbọ hụ na oke ndị Igbo ruru ha aka.

Cheta na gọvanọ Umahi kọwara na ihe o ji pụọ na PDP bụ maka mmegbu ha na-emegbu ndị mpaghara Ọwụwa Anyanwụ kamgbe afọ 1999.

Aha onyonyo, Ihe ndị Ebonyi kwuru maka Umahi ịbanye APC

Mana Nwobodo jụrụ sị: "Ebe Umahi sị na PDP enyeghị ndị Igbo ohere ịbụ onyeisiala, ọ bụ APC ga-enye ha ya bụ ohere?"

"Ihe m nọ ugbua bụ 'sidon look', ka anyị lewenụ anya mara etu okwu a ga-esi gadebe," Nwobodo kwuru.

Gbasara ịgba mbọ ka onye Igbo nweta ọkwa onyeisiala, Jim Nwobodo kwuru na ya kwadoro atụmatụ ahụ nke ọma, mana oge ka fọrọ tupu amalite ịkpa ya bụ nkata nke ọma.

Mbata Gọvanọ David Umahi na APC bụ maka ọdịmma ndị Igbo - Joe Igbokwe

Joe Igbokwe

Ebe foto si, Joe Igbokwe/Facebook

Onye bụbụ odeakwụkwọ mgbasaozi otu APC na Legọs steeti bụ Joe Igbokwe ekwuola na obi bụ ya sọ polina polina dịka aka na-achị Ebonyi steeti bụ David Umahi hapụrụ PDP bata n'otu APC.

Na mgbarịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'abalị Tọzde, Igbokwe kwuru na ọpụpụ Gọvanọ David Umahi pụrụ na PDP banye ga-ewetara Igbo oke pati ahụ wọrọ ha na Naijiria kemgbe ha jiri malite.

Ọ sịrị na ihe mere Umahi jiri hapụ PDP bụ na "nwa ọ na-eku anwụọla."

"PDP anwụọla na Ọdịda Anyanwụ(South West. Ọ na-achọ ịnwụ na Ọwụwa Anyanwụ(South-East)."

"Ọ bụrụ na ị bịara iku nwa, nwa ị na-eku anwụọ, gịnị ka ị ga eme? Ị lawa. PDP anwụọla."

Ọ gara n'ihu kwuo na o nweghị ihe ndị Igbo ritere na nkwado PDP afọ iri na isii ha nọrọ n'ọchịchị mana na ha ji anya ahụ ihe APC na-emere ha na-agbanyeghị.

O kwuru na APC arụwala ndị Igbo akwa Naijia nke abụọ nke PDP emelighị karịa iji ya azụ okwe ndọrọndọrọ ọchịchị.

Igbokwe onye kwupụtara olileanya na ndị gọvanọ ndị ọzọ ka-eso Umahi bata APC, kwuru na ụwa ga-akara Igbo mma ọ bụrụ na ha nyewa otu APC nkwado zuru oke.

Cheta na Ụmahi hapụrụ PDP na nsonso ma kwuo na ihe mere ya jiri zọpụ ụkwụ bụ n'ihi mmegbu PDP na-emegbu ndigbo kemgbe afọ 1998 ha banyere n'ọchịchị.

Gọv David Umahi

Ebe foto si, David Umahị onn Facebook

Onye ndụmọdụ Gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi Steetị n'okwu nchekwa bụ Chidiebere Egwu agbaala arụkwaghịm n'ọrụ ya.

Egwu bụbukwa onyeisi okpuruọchịchị Ikwo sị na ọ ka-abụ onye otu PDP na-agbanyeghi na Umahi banyere APC, nke a mere o ji gbaa arụkwaghịm.

Cheta n'izu gara aga ka Gọvanọ Umahi kwupụtara uche ya ịbanye APC, ọtụtụ ndị APC n'Ebonyi gbakwara arụkwaghịm n'ọrụ ha.

Akwụkwọ arụkwaghịm

Ndị gọvanọ APC atọ awụchiela Ebonyi Steetị ịnabata Gọvanọ Dave Umahi

Ndị gọvanọ APC bịara ịnabata Umahi n'otu ha

Ebe foto si, Eze Collins

Ndị gọvanọ APC atọ awụchiela Ebonyi Steetị ịnabata Gọvanọ Dave Umahi n'ime otu.

Nke a na-abịa dịka Umahi nakwado emume mwụfe ya site na PDP banye APC n'ụbọchị Tọsde 19 ọnwa Nọvember, 2020.

Ndị gọvanọ gụnyere Mai Mala Bala nke Yobe Steetị, Abubakar Atiku Bagudu nke Kebbi na Mohammed Badaru nke Jigawa Steetị.

Ndị gọvanọ APC bịara ịnabata Umahi n'otu ha

Ebe foto si, Eze Collins

Osote gọvanọ Ebonyi Steetị bụ Kelechi Igwe na onyisi ụlọomeiwu ha bụ Francis Nwifuru nabatara ndị a n'ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu.

A na-atụ anya na ndị gọvanọ abụọ ọzọ ka ga-awuchi n'Ebonyi maka emume a.

Elders Council: E wepụla Franklin Nchita Ogbuewu were Okah dochie ya

Dịka Gọvanọ Ebonyi steeti hapụrụụ PDP gawa APC, e kposala ọgbakọ ndị okenye steeti ahụ a kpọrọ "Elders Council" nkeFranklin Nchita Ogbuewu nọ n'isi ya ma weren Ben Oka dochie ya. .

Dịka ozi nke Kọmishọna mgbasaozi steeti ahụ bụ Uchenna Orji si kwuo , "ọ bụ iji kpalite mụọ ọhụrụ notu ahụ dịka gọvanọ Dave Umahi siri nye ntuziaka ka ekposaa ndị ndu ọgbakọ ahụ malite n'abalị 18 nke ọnwa Novemba."

Ọ gara n'ihu kwuo na onyeisioche ọhụrụ bụ Ben Okah ga-amalite ọrụ ozigbo.

Nzọpụ ụkwụ gọvanọ Umahi a na-abịa dịka Ogbuewu jụụ iso ya banye otu APC.

Onyeisioche PDP n'Ebonyi ajụla ịrịtu n'ọkwa ka Gọv. Umahi banyechara APC

Ọkaiwu Onyekachi Nwebonyi

Ebe foto si, Barr. Onyekachi Nwebonyi

Onyeisioche otu PDP na Ebonyi steeti na-apụ apụ bụ Ọkaiwu Onyekachi Nwebonyi ekwuola na ma e tere ogiri ma e tere ụgba na ya ka bụ onyeisioche pati ahụ na steeti ahụ.

Nkwupụta ya a na-abịa dịka ndị isi PDP etiti nọ n'Abuja gbosara otu ndị isi nke Ebonyi steeti dịka akụkọ pụtara nke kwuru na Govanọ Umahi ahapụla pati ha gawa APC.

Aha onyonyo, Orji Uzo Kalu sị na o dịzị ka ndị Naijiria anaghịzi ahụ onwe ha n'anya

Mana Nwebonyi kwuru na mkparịtaụka ya na andị ntakụkọ nwere n'Abakaliki ụbọchị Wenezde na mkposa otu ha megidere iwu ma sị na ya ga-agbagha ya bụ mkpebi PDP etiti n'ụlọikpe.

Ọ sị, "Anya mụ eluola akwụkwọ mgbasaozi nke odeakwụkwọ etiti PDP wepụtara nke o kwuru na e kposaala ndị isi pati na Wọọdụ, okpuru ọchịchị nakwa nke steeti na Ebonyi n'ihi na Gọvanọ David Umahi chọrọ ịga APC."

" Ọ bụ ihe ịkpa ọchị na ndị isi pati n'etiti kulitere kposa ndị isi nke steeti n'ihi na gọvanọ na mmadụ ole na ole chọrọ ịhapụ pati."

Aha onyonyo, 2023 Election: 'Ndị ọchịchị na-akawapụ ndị Igbo akwapụ' - Ezeife

"Anyị bụ ndị na-elekọta pati aha n'Ebonyi steeti rue afọ anọ na-abịa. dịka a họpụtara anyị site na ntuliaka e mere na nsonso a."

Nwebonyi gara n'ihu kwuo na ndị ndu PDP n'Ọwụwa Anyanwụ agaghị enye ohere ka e were aghụghọ ghọpụ Ọwụwa Anyanwụ n'ọkwa onyeisiala n'afọ 2023, mana ha hara ka akpazi ụka kama ịhapụ pati ha.

Odeakwụkwo APC n'Ebonyi steeti agbaala arụkwaghị m maka mbata Umahi n'APC

Dave Umahi na Chika Nwoba

Ebe foto si, BBC/ Nwoba Facebook

Nwoba Chika Nwoba bụ odeakwụkwọ pati APC dị n'Ebonyi steeti agbala arụkwaghị m maka mbata gọvanọ Dave Umahi na pati ahụ.

Nwoba kwuru na ọ gbara arụkwaghịm makana ọ hụghị gọvanọ Umahi dịka onye bu ọdimma ndị Ebonyi n'obi nakwa ọ chọghị ka o nọrọ n'etiti udiri ọchịchị ndughie ya.

Nwoba depụtara maka igba arụkwaghịm ya n'akara facebook ya.

Chika Nwoba

Ebe foto si, Chika Nwoba facebook screengrab

O kwuru na mbata Umahi n'Ebonyi steeti ga-ebutere steeti ahụ ezigbo nsogbu makana Umahi ga-aghasa pati APC tupu ọnwa Aprelu nke afọ 2021.

Mbọ BBC Igbo gbara ịnụta n'ọnụ onye mgbasaozi Dave Umahi bụ Uchenna Orji kpụrụ n'ala makana o bughi ekwenti ya.

Etu onyeisoche APC si nabata gọvanọ Dave Umahi na pati ya

Onyeisioche All Progressives Congress (APC) dị n'Ebonyi aha ya bụ Eze Nwachukwu kwuru na ha anabatala mbata gọvanọ DaveUmahi nke Ebonyi steeti na pati ha.

O kwuru na Umahi mere ihe gosiri na o nwere amamihe ma burukwa ọdịmma ndị Igbo n'obi.

O kwuru na ọ chọrọ ka gọvanọ ndị ọwụwa anyanwụ ndị ọzọ batakwuo na APC ka agbakọ aka nwete ọkwa onyeisiala n'afọ 2023.

Odeakwụkwọ APC Ebonyi steeti ọ gbara alụkwaghịm maka mbata gọvanọ Umahi?

Onyeisioche APC n'Ebonyi bụ Eze Nwachukwu kwuru na o nweghị mgbe ozi na odeeakwụkwọ APC Ebonyi steeti zitere ya ozi na ọ na-agba arụkwaghịm.

O kwuru na ọ na-anụ ozi ahụ etu a anyị si anụ ya dịka kepukepu.

Mbọ BBC gbara ịnụta n'ọnụ Chika Nwoba bụ odeakwụkwọ APC n'Ebonyi steeti kpụrụ n'ala dịka ekwenti ya na-ekwu na-agbanyụrụ ya.

Cheta na aka na-achị Ebonyi steeti bụ Dave Umahi kwuru na ọ bụ maka mmegbu ndị PDP na-emeso mpaghara ọwụwa anyanwụ mere o ji pụọ na pati ahụ.

A ma m ihe mere Dave Umahi ji si PDP gbalaga APC- Nyesom Wike

Umahi na Wike

Ebe foto si, Umahi and Wike's social midia handle

Aka na-achị Rivers State bụ Nyesom Wike ekwuola na ọ bụ maka ịchọta ọkwa onyeisiala Naịjirịa mere gọvanọ Dave Umahi ji gbabaa pati APC nọ n'ọchịchị ugbua.

O kwuru na ọ bụghị okwu ikpe akwụghị ọtọ nye ndị mpaghara ọwụwa anyanwụ kpatara ọpụpụ Umahi dịka akụkọ si ekwu.

O kwuru na ọgbagojughị ndị bụ ezigbo ndị otu PDP anya na Umahi agawala APC makana o teela okwu na-egosi na nke a ga-eme.

Wike kwuru na etu Umahi si kwuo na ọ bụ mmegbu PDP na-eme ndị ọwụwa anyanwụ bụ ihe were ya iwe maka ọpụpụ Umahi.

'Ugbua e nweela m nwanne na APC' - Hope Uzodimma

Uzodimma na Umahi

Ebe foto si, Uzodimma na Umahi's Facebookpage

Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodimma eziela ozi nnabata Dave Umahi na-achị Ebonyi steeti dịka ọ batara otu APC.

N'ozi nke o ziri n'akara Twitter ya, Uzodimma kwuru na ọ bụ ọṅụ ka o ji nabata akụkọ na Dave Umahi ahapụla otu PDP bata na APC.

"Ugbua, ọ bụghị naanị m bụ onye APC nọ na mpaghara ọdịda anyanwụ, e nweela m nwanne ugbua" ka o kwuru."

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ihe otu PDP kwuru maka ọpụpụ Umahi

N'otu aka ahụ, otu PDP ekwuola na Davew Umahi na onwe ya bụ onye ma ihe o ji hapụ otu ha nke ga-apụta ihe mgbe oge ruru.

Ha kele kwara ya maka ọrụ niile na mbọ niile ọ gbaara otu ha kemgbe o bara n'ọkwa ọchịchị n'afọ 2003.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Gọvanọ Dave Umahi sị na onweghi mwute ọbụla ịhapụ PDP banye APC

Dave Umahi na Onyeisiala Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Presidency/Twitter

Gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi Steetị sị na onweghi mwute ọbụla maka ịhapụ Peoples Democratic Party mabanye n'All Progressive Congress.

O kwuru nke a mgbe ọ na-agba ndị ntaakụkọ okwu n'Abakaliki ma sị na ọ bụ maka mmegbu ndị PDP na-emegbu ndị mpaghara Ọwụwanyanwụ.

Ọ sị na mkpebi a abụghị maka na o nwere nkwa APC kwere ya kama ọ bụ ụzọ o nwereike iji gosi iwe ya na mmegbu PDP na-emegbu ndị Ọwụwanyanwụ kamgbe afọ 1998.

Ọ sị na mwụfe ya a ga-eme ka anya mepee ndị PDP ka ha mara ọbụla naanị otu onye nwere ikike ime ihe ọbụla ọ chọrọ.

Ọ katọkwara akụkọ na-ekwu na ọ bụ maka PDP jụrụ inye ya ohere ka ọ zọọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2023 na-abịa abịa.

Gọvanọ Umahi bụ onyeisi ndị govanọ Owụwanyanwụ sị na afọ juru ya n'ogogo o rurula na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ọ ga-alaghachị n'azụmaahịa ya ma ọ rịtuo n'ọkwa n'afọ 2023.

Ihe anyị ma maka akụkọ na gọvanọ Dave Umahi awụbanyela na APC

Gọv David Umahi

Ebe foto si, David Umahị onn Facebook

Akụkọ na-efegharị kamgbe taa bụ ụbọchị iri na otu nke ọnwa Nọvemba afọ 2020 bụ na Gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi esila na pati ya bụ 'People's Democratic Party' wụbanye pati 'All Progressives Congress'.

Nke a mere ka ndị mmadụ kpụrụ ya n'ọnụ na soshal midia.

Gọvanọ Dave Umahi ọ wụbanyela na APC?Lee ihe ha gwara anyị

Onye na-ahụ maka mgbasa ozi gọvanọ Ebonyi steeti bụ Francis Nwaeze gwara BBC na o nweghị ka mbanye gọvanọ Umahi na APC ga-esi bụrụ kepu kepu.

O kwuru na udiri ọkwa Gọvanọ Umahi ji dịka onyeisi ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ ekwesịghị ka njem ya si otu patị fere ọzọ bụru ihe a ga-ekpuchị ekpuchi kama na "anyị cherekwuo ."

N'okwu ya, ọ bụrụgodi na akụkọ a na-efegharị, o nweghi mgbe gọvanọ ji were ọnụ ya gwa ụwa na o sila PDP fere APC.

BBC Igbo gbara mbọ ịnụta n'ọnụ odeakwụkwọ mgbasaozi ndị PDP bụ Kola Ologbodiyan mana o zaghị ekwenti ya.

Gọv. Dave Umahi nke Ebonyi steeti

Ebe foto si, EBONYI GOVERNMENT

Nkọwa foto, Ọtụtụ na-ekwu na Umahi nwere ike ịpụta ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ntuliaka 2023

Ụlọntaakụkọ Punch dere akụkọ na-ekwu na Umahi gwara onyeisioche PDP bụ Uche Secondus, na ya chọrọ ịbanye APC.

Dịka akụkọ ahụ si kwuo, Umahi kwuru na ihe kpatara ya ji chọọ ịba APC bụ maka na ha ekwela inye onye si mpaghara Ọwụwa anyanwụ Naịjirịa nkwado ịzọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2023.

Umahi kwuru na ọ bụrụ na ndị PDP kwe ya nkwa na ha ga-akwado onye Igbo ịbụ onyeisiala na 2023, na ya agaghị apụ na Pati ahụ.

Kepukepu apụtala ugboro ugboro na Dave Umahi na-atule ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa na 2023.

Mana onwebeghị mgbe ọ pụtara were ọnụ ya kwupụta nke a.

Mgbe gọvanọ Umahi wepụrụ onye na-ahụ maka mgbasa ozi ya

Gọvanọ Dave Umahi nke Ebonyi Steeti ewepụla Emmanuel Uzo dịka onye na-ahụ maka mgbasa ozi.

Kọmishọna na-ahu maka mgbasa ozi n'Ebonyi steeti bụ Uchenna ọrji gwara BBC na ọchụchu mazi Uzo bụ eziokwu.

Kama ọ sị na ọ matachabeghi ihe mere eji chụọ ya n'ọrụ ma ọ bụ onye ga-anọchi anya ya.

N'aka nke ọzo, ndị ọrụ gọọmenti Ebonyi na-achoghi ka akpọ aha ha kwuru na nke a bụ maka na Mazi Uzo arụzighị ọrụ ya nke ọma.

Ọ bụ ihe gbasara atụmatụ 'National Livestock Transformation Plan Programme' nke gọvanọ kwuru na Uzo anochịteghi anya ya ọfụma.

Onye a kwuru na e nyeghi ya ikeke igwa ndị ntaakuko okwu banyere ya bụ atụmatụ ma kwukwa na ihe Uzo gwara ndi ntaakụkọ dị iche na ihe ndị Gọvanọ Ọwụwa anyanwụ kwekọrịtara.

Dịka ọ dị ụgbụ a amabeghị onye ga-anọchite anya emmanuel Uzo.

Gụ akụk ga-amasi gị

Lee ihe nkịri ga-amasi gị

Aha onyonyo, Sports betting: Ihe ọghọm dị n'ịgba chaa chaa