Buhari na Umahi: Lekwa ihe dapụtara na nzụkọ Gọvanọ Umahi na Onyeisiala

Ebe foto si, facebook.com/femi.adesina
Igbo na-atụ ilu na ozi e ziri anwụrụọkụ ga-eru eluigwe ntị.
Nke a mere gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi jiri gbaruo Abụja ụbọchị Tọọzde maka ozi ndị gọvanọ ọwụwa anyanwu zipuru ya mgbe ha nwechara nzụkọ na Satọdee.
Onyeisi ntaakụkọ Ụmahị bụ Emmanuel Uzo gwara BBC Igbo etu nzụkọ Umahị na Onyeisiala Muhammadu Buhari siri gaa.
Lee ihe ndị ọ kwuru:
Ihe gbasara mmachị ndị ọchị ehị:

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala bụ Muhammadu Buharị kwetere na nke a dịka Gọvanọ Dave Umahi kọwara na ọbụ ndị ọchị ehi na-ebu egbe 'AK-47' si mba ọzọ dịka Niger, Chad na mba ndị ọzọ ka ndị Gọvanọ ọwụwa anyanwu machiri na ọbụghị ndi nke bị na ọwụwa anyanwụ kemgbe.
Ọdọ Ugbọelu Akanu Ibiam nke Enugu Steeti:

Umahi kwuru maka akwụkwọ ndị gọvanọ ọwụwa anyanwu degaara onyeisiala maka irụzi ọdọụgbọelu Akanu Ibiam nke dị na Enugwu. Onyeisiala nabatara ya ma Umahi rịọkwara ya ka a gbatia ụzọ ugbọelu si efepu ka ọ nwee ike i nabata ụgbọelu ndị buru ibu.
Irugharị okporo ụzọ esi abata ọwụwa anyanwụ :
Onyeisiala kwetere na arịrịọ Umahi rịọrọ maka idozi okporo ụzọ e si abata ọwụwa anyanwu ka ọ dịrị ndị mmadụ mfe ibata ma na-apụkwa.
Iruzi ụgbọ oloko na ihe eji amị ikuku "gas"

Ebe foto si, Getty Images
Umahi rịọkwara onyeisiala ka ọ tinye anya na iruzi igwe ụgbọoloko na-agba ma tinyekwa anya n'ihe gbasara igwe eji amipụta "gas" n'ọwụwa anyanwu.
Ọ gwakwara Buhari na ọ ga amagbu onwe ya ma enwee ọgbakọ ebe ya na ndi gọvano na ndị ndụ ndị Igbo ndị ọzọ ga-akparịta ụka.
N'Ikpeazụ
Dịka Emma Uzo si gwa BBC, onyeisiala kwetere ihe niile Umahi rịọrọ ya.

Akụkọ ga-amasị gị











