Bianca Ojukwu, Patience Ozokwo, Chika Ike na ụmụada Enugu state ndị ọzọ 'na-eweta ọkụ' na Nigeria

Ebe foto si, Instagram
- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Ụmụnwaanyị Enugwu steeti egosila na ha bụ ajọ anụ ma a bịa n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, ime ejije, ịgụ egwu nakwa ihe ndị ọzọ.
Nke a mere na enweghi etu a ga-esi kọwa akụkọ gbasara Naịjirịa ghara ịkpọta aha ụmụnwaanyị ole na ole ndị a, gosirila ihe ha pụrụ ime.
Lee ndị welitere isi BBC Igbo gbara n'anwụ:
Bianca Ojukwu

Ebe foto si, Facebook/Bianca Ojukwu
Ojukwu bidoro n'agbọghọ, oge ọ ka na-aza Onoh, kpawa ike. Oge ahụ ka o meriri n'asọmpi e ji ama nwaanyị kacha maa mma na Naịjirịa; n'afọ 1988.
Nna ya bụ Christian Onoh bụbu gọvanọ Anambara steeti, o mechara lụọ Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu bụ onye hibere Biafra.
Ọ bụ ọkaiwu, onye ndọrọndọrọ ọchịchị, ọ rụọla dịka onye nnọchiteanya Naịjirịa na mba Spen, ọ bụkwa onye ojiegoachụego.
A mụrụ ya n'ụbọchị ise nke ọnwa Ọgọstụ 1968.
Cecilia Ezeilo

Ebe foto si, Ezeilo
Ezeilo bụ osote gọvanọ ugbua, bụ nwaanyị mbụ na-enweta ọkwa ahụ n'Enugwu steeti.
Ọ rụburu dịka onye omeiwu n'Enugwu steeti, ọ bụ ọkaiwu, ma bụrụkwa lọlọ (di ya nwụrụla ugbua bụbu eze ndị Ozom Aguobu Owa).
A mụrụ ya n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Jenụwarị 1966.
Ndi Okereke-Onyiuke

Ebe foto si, Getty Images
Okereke-Onyiuke so n'ime ụmụnwaanyị ndị nwere agba n'ihe gbasara akụnaụba Naịjirịa.
Ọ bụ nwaanyị mbụ nọ n'oche ọchịchị dịka onyeisi n'ụlọọrụ "Nigerian Stock Exchange".
A mụrụ ya n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Nọvemba 1950.
Patience Ozokwo

Ebe foto si, Instagram/Patience Ozokwo
Ozokwo bụ ezigbote "agụ nwaanyị" n'ihe gbasara ime ejije.
Kedụ nke ọ na-amaghị eme? Ọ gụọla egwu, ọtụtụ ndị na-eme ejije anaghị ahụ azụ ya anya maọlị.
A bịa n'ihe nrite, o kpokọọla ya ebe ọ dị ọtụtụ.
A mụrụ ya n'ụbọchị 14 nke ọnwa Septemba 1958.
Tina Mba

Ebe foto si, Instagram/Tina Mba
Ị hụtụla ihu nwaanyị a n'ihe onyonyo gị na-ajụ "kedụ ebe ọmalịcha nwaanyị a si?" Ngwa lekwa azịza gị ebe a.
Mba bụ ome ejije e ji ama atụ.
A mụrụ ya n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Ọktoba, 1975.
Ego Boyo

Ebe foto si, Instagram/OfficialEgoBoyo
Ego Boyo (Nna ya bụ Ọkaikpe Augustine Nnamani nwụrụla anwụ) bụ ome ihe nkiri na Nollywood oge ndị dịka Richard Mofe Damijo (RMD) malitere iwu n'ihe dị ka afọ 22 gara aga.
Ị chetara ihe nkiri a kpọrọ "violated"? Kedụ maka "Checkmate"?
Ọ bụkwa onye ojiegoachụego.
A mụrụ ya n'ụbọchị isii nke ọnwa Septemba, 1968.
Uzoamaka Nwanneka Aduba

Ebe foto si, Instagram/Uzo Aduba
Aduba so na ndị Naịjirịa aha ha na-ewu ewu na Hollywood maka ime ejije.
Ọ gụrụ egwu na mahadum, sonyekwa n'egwuregwu dịka ọgba ọsọ.
O nwetala ọtụtụ ihe nrite kemgbe ọ malitere ime ejije.
A mụrụ ya n'ụbọchị 10 nke ọnwa Febrụwarị 1981.
Mary Remmy Njoku

Ebe foto si, Instagram/Mary Remmy Njoku
Njoku so na ndị na-eme ka aha Nollywood na-ada ụda ugbua site n'ohere o nyere iji egosipụta ejije ha.
Ọ na-esonye ma na-emepụtakwa ejije.
A mụrụ ya n'ụbọchị 20 nke ọnwa Maachị 1985.
Chika Ike

Ebe foto si, Instagram/Chika Ike
Ike bụ "ajọ anụ" ma a bịa n'ime ejije na Nollywood, ọ na-emepụtakwa ihe nkiri.
Ọ bụkwa onye ojiegoachụego nwere ụlọọrụ na-emepụta ihe ntecha nke ọnụ, o dekwaala akwụkwọ.
O nwetala ọtụtụ ihe nrite maka ime ejije.
A mụrụ ya n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Nọvemba 1985.
Uche Ogbodo

Ebe foto si, Uche Ogbodo
Ogbodo bụ otu nwaanyị anaghị ata ntị ya ata.
O meela ọtụtụ ejije na Nollywood kemgbe ọ malitere.
A mụrụ ya n'ụbọchị 17 nke ọnwa Mee 1986.
Rachael Okonkwo

Ebe foto si, Instagram/Rachael Okonkwo
Okonkwo so na ndị "ọgbara ọhụrụ" Nollywood bụzị a kwaa a kwụrụ ugbua.
A bịa n'egwu ọ ma-agba, a bịa n'ime ejije, ebe ahụ ka ọ na-enwu ka ọkụ.
A mụrụ ya n'ụbọchị 26 nke ọnwa Mee 1987.
Zain Ejiofor Asher

Ebe foto si, Getty Images
Asher aha nna ya bụ Ejiofor bụ onye ntaakụkọ pụrụiche.
Ọ gụkwara asụsụ "Spanish" na "French" na mahadum.
A mụrụ ya n'ụbọchị 27 nke ọnwa Ọgọstụ 1983.
Chidinma na Chidiebere Aneke

Ebe foto si, Instagram/Chidiebere Aneke
Ụmụ ejima a emeela ihe e ji echeta ha na Nollywood.
Ha na-eme ejije, na-ebiputakwa nke mbiputa. Otu n'ime ha gụrụ akwụkwọ dịka onye ọrụ ụlọakụ, ebe nke ọzọ gụrụ maka mgbasaozi.
A mụrụ ha n'ụbọchị 24 nke ọnwa Ọgọstụ 1986.
Yvonne Akuabata Ogbuogu - Stormrex

Ebe foto si, Instagram/Stormrexofficial
Ogbuogu so na ndị na-eme ka egwu ndị Igbo na-aga ahịa na Naịjirịa ugbua.
Egwu ya ndị dịka 'kererenke' na ndị ọzọ wuru ewu n'ala Igbo.
Ọ na-ede egwu, na-agụ agụ, na-agba agba.
A mụrụ ya n'ụbọchị 18 nke ọnwa Septemba 1987.
Megalyn Echikunwoke

Ebe foto si, Instagram/Megalyn
Echikunwoke bụ ome ejije na Hollywood nke mba Amerịka.
A mụrụ ya n'ụbọchị 28 nke ọnwa Mee 1983.
Amaka Igwe

Ebe foto si, Instagram/OfficialEgoBoyo
Igwe bụbu otu nwaanyị a na-asị "unu abịala" n'imepụta ejije na Nollywood.
Igwe mepụtara ọtụtụ ihe nkiri, ọ bụkwa site n'ihe nkiri ndị o mepụtara ka ọtụtụ ndị na-eme ejije na-ewu ewu ugbua si chakee.
O nwere ụlọọrụ redio na Legọs, ọ na-ede ejije ma bụrụkwa onye nkuzi.
A mụrụ ya n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Jenụwarị 1963, ọ nwụọ n'ụbọchị 28 nke ọnwa Epreelụ 2014.
Ndị ọzọ gụnyere Fidelia Njeze bụbu mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọelu nakwa onye nnọchiteanya ndị Naịjirịa na mba Swizaland, Chinwe Owoh bụ ome ejije a ma ama nakwa ndị ọzọ.
Kedụ onye aha ya adịghị ebe a?
Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri a ga-amasị gị:









