Sinach, Angela Okorie na ụmụnwaanyị Ebonyi state Nigeria enweghi ike ichefu aha ha

Sinach, Chacha Eke na Angela Okorie

Ebe foto si, Instagram/BBC

    • Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo

N'ezinaụlọ niile, nwaanyị bụ ngalaba ji isi ụlọ, etu a ka ọ dịkwa n'Ebonyi steeti nakwa Naịjirịa.

Dịka anyị si wetara gị akụkọ ụmụnwaanyị nakwa ndị bụ agbara nwaanyị si Anambara steeti, anyị chọrọ igosi gị ndị nke si Ebonyi steeti.

Ụmụnwaanyị Ebonyi mara mma, ma nwekwaa ụbụrụ, nke mere ka ha na-enwuke ebe ọbụla ha gara.

Lee ndị meterela ihe e ji kpụrụ ha n'ọnụ:

Priscilla Ekwere Eleje

Priscilla Eleje

Ebe foto si, Facebook/Priscilla Eleje

Nkọwa foto, Ị na-agụ ego puku naịra, lezie anya ọfụma ka ị hụ mbinyeaka nwaanyị a

Eleje bụ nwaanyị mbụ mbinyeaka ya (signature) na-apụta n'ego Naịjirịa n'ime afọ iri isii na otu (61).

Ọ bụkwa nwaanyị mbụ ga-anọ n'ọkwa "Director of Currency Operations" n'ụlọakụ etiti a kpọrọ Central Bank (CBN) n'olu Bekee, na Naịjirịa.

Ọ bụkwa nwaanyị agụmakwụkwọ anaghị ara ahụ, dịka o nwere asambodo dị iche iche gosiri na ụbụrụisi ya na-apụ ọkụ.

Uche Azikiwe

Na Azikiwe lụrụ otu dike ala Igbo na Naịjirịa bụ Nnamdi 'Zik' Azikiwe abụghị naanị ihe aha ya ji dịrị n'ime akụkọ a.

Ị ma na Azikiwe bụ ọkammụta na mahadum Nsụka?

O sokwa na ndị nọ n'oche na-ahụ maka etu ihe si aga n'ụlọakụ etiti (CBN).

Azikiwe so na ndị nwetarala ihe nrite Member of the Order of the Federal Republic (MFR).

A mụrụ ya n'ụbọchị anọ nke ọnwa Febrụwarị, 1947.

Osinachi 'Sinach' Joseph (Kalu)

Sinach

Ebe foto si, Instagram/therealsinach

Nkọwa foto, Sinach agaala ọtụtụ mba dị iche iche gaa gụọ egwu ya

Sinach dịka e si mara ya, bụ otiegwu pụrụiche.

Ihe gbasara Chineke na ụka Kraịst na-amasị ya nke ukwu, mere ka ọ na-eti naanị egwu ụka.

A ga-ekwu ole ghara ole? Ọ na-agụ agụ, ma na-edekwa ede.

O nwetala ọtụtụ ihe nrite maka egwu ya.

A mụrụ ya n'ụbọchị 30 nke ọnwa Maachị, 1973.

Angela Okorie

Angela Okorie

Ebe foto si, Instagram/realangelaokorie

Ị jụọ mmadụ "kedụ aha ndị a ma ama si Ebonyi steeti?" ma ha akpọghị aha Okorie, mara na onye ahụ amaghị steeti ahụ.

Okorie so na ndị aha ha na-ada ụda na Nollywood, ebe o merela ọtụtụ ejije.

A mụrụ ya n'ụbọchị 18 nke ọnwa Ọgọstụ 1986.

Charity 'ChaCha' Eke-Faani

Chacha Eke

Ebe foto si, Instagram/chachaekefaani

Nkọwa foto, Cha Cha Eke bụ nwa kọmishọna na-ahụ maka agụmakwụkwọ n'Ebonyi steeti bụ Ọkammụta John Eke

Eke bụ onye na-eme ejije na Nollywood.

N'agbanyeghi na ọ ka bụ ezigbo nwaagbọghọ, o meela ọtụtụ ihe nkiri karịrị otu narị.

A mụrụ ya n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Mee, 1993.

Grace Amah

Grace Amah

Ebe foto si, Instagram/Grace Amah

Ị bụrụ onye na-ele ihe nkiri ndị Nollywood mgbe gboo, ị ga-amarịrị onye Amah bụ.

Aha ya wuru ewu ọfụma oge ndị dị ka Sandra Achums, Regina Askia na Rita Nzelu "na-achị" Nollywood.

A mụrụ ya ụbọchị 23 nke ọnwa Febrụwarị.

Maria Ude Nwachi

Maria Ude Nwachi

Ebe foto si, Facebook/Maria Ude Nwachi

Nwachi bụ aka ochie n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị n'Ebonyi steeti.

Ọ rụọla dịka onye omeiwu nta na-anọchite anya ndị Afikpo Nọt-Ist.

Ọ bụ ya hibere otu ndị Igbo kacha nwee mmadụ na Facebook.

A mụrụ ya ụbọchị 29 nke ọnwa Septemba, 1970.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Egwu Oke Nkwa