Cabinet Reshuffle: Ụmụada Ebonyi steeti arịọla ka gọmenti etiti cheta ha n'ọchịchị

Ụmụada Ebonyi steeti

Otu jikọtara ụmụnwaanyị n'Ebonyi steeti akpọrọ Ebonyi Women Vanguard (EWV) arịọla onyeisiala Muhamadu Buhari ka o biko cheta ha mgbe ọ ga-ekewa ọchịchị n'agba ọchịchị nke ugbua.

Onyeisi ụmụnwaanyị a bụ Immaculata Ibe rịọrọ arịrọ a taa n'Abakaliki tupu gọmenti steeti ahụ enyefewe akwụkwọ ndị ha chọrọ ka gọmenti etiti nye ọkwa minista.

Otu a nọchiri anya ụmụnwaanyị bi na ụzọ na ndị bi n'ama sị na oteela eleghawara ụmụada steeti ahụ anya n'ọkwa ọchịchị gọmenti etiti.

Immaculate sị 'anyị na-arịọ ka onyeisiala Buharị tinye, ọbụnadị otu nwaanyị, n'ọkwa gọmenti etiti mgbe ọ ga-eru".

Aha onyonyo, Abakalịkị aghọọla ebe ọkụ na-enwu n'elu

O kwuru na ọnwebeghị mgbe nwaada Ebonyi sugoro dị ka Minista na Naịjirịa kemgbe ekere ya bụ steeti n'afọ 1996 agbanyeghị na ogbo ha ndị ala Igbo ndị ọzọ anọchaala na ya bụ ọkwa di elu.

Immaculata sị na a na-akpachapụ ha n'ụsọ agbanyeghị ezigbo ọrụ niile ha na-arụ na Naịjirịa.

Ọ na-arịọ ka a kpụọ ha isi akpụrụ albati.

Lee ihe nkiri anyị

Aha onyonyo, International Women's Day: 'Agaghị m ata onwe m ụta na m bụ nne na-arụ orụ- Ngozi Nwobia

Akụkọ ga-amasị gị