Building Collapse: Ihe mere na anyị etinyeghị ndụmọdụ NIA n'ọrụ - Gọọmenti Anambra

Igwe 'Tractor' na ekpofu aja ụlọ daara ada

Ebe foto si, NNAMDI NWOYE

Nkọwa foto, 'Gọọmenti so na ihe mere ụlọ ji ada n'Anambra steeti ' Arc. Osita Okafọ

Anambara steeti ekwuola ihe mere na steeti ahụ etinyeghị atụmatụ nke ndị otu jịkọrọ na-atụpụa ụkpụrụ ụlọ nke a kpọrọ "Nigerian institute of Architects" (NIA) tụtara maka ịkwụsị ụlọ ọdịda na steeti ahụ.

Kọmishọna Anambara Steeti na-ahụ maka gburugburu bụ Michael Okonkwo gwara BBC na ọ bughi eziokwu na Gọvmenti Anamabra steeti etinyeghi aro na nchọputa ndị ọkamuta n'ihe gbasatara ịrụ ụlọ, nke ha nyere Gọọmenti na 2014 maka igbochi ụlọ ida n'Anambra steeti.

Maazị Okonkwo kwuru nke a dịka nzaghachi okwu ọnyeisi ndị 'NIA' nke Amanbra steeti bu mazi Osita Okafor gwara ndi mgbasa ozi na Gọọmenti Anambra steeti dara ọnyụpa na itinye aro na nchọpụta e mere maka ihe gbasara ụlọ na-ada n'Anabmra steeti. Ndị otu a kwuru na-emeghi nke a soro n'ihe mere aka Gọọmenti Anambra steeti jiri wee dị n'ihe mere ụlọ ji ada n'Anambra ahụ.

Micheal Okonkwo gara n'ihu kwuo na ha ga-etinyekwa ndị ọkamụta a na-akpọ "Architect" n'olu Bekee n'ime Kọmitii ọhụrụ Gọvanọ Willie Obiano hibere maka ịchọputa ihe mere ụlọji ada ma inyekwa aro maka igbochi ụlọ ida n'Anambra steeti.

Ọ dọkwara ndị anambra steeti aka na ntị were sị na onye chọrọ ịrụ ụlọ jisie ike nata ikike eji arụ ụlọ na Anambra steeti tupu ha ebido ịrụ ụlọ.

Cheta na ụlọ elu dara n'Onicha nso nso a.