Building collapse: Ụlọ adagbuola nwaokorobịa n'Enugwu

Ihe ịgba anya mmiri mere n'Idaw River Enugwu ebe ụlọ a na-arụ arụ dagburu otu nwa nwoke na-enyere aka na ya bụ ọrụ.
Chidera Odoh, onye gbara afọ iri abụọ na otu nọ na okpuru ụlọ ahụ arụ ọrụ ya, oge ozere ma dagbuo ya.
Ndị gburu gburu Ikirike village n'Ijwa Idaw River gbara mbọ ịdọpụta ya bụ nwatakịrị na ndụ mana okweghị ha.
Ndị otu SEMA, NEMA, REDCROSS na ECTDA butere ụgbọala 'caterpillar' na ngwaọrụ ha ndị ọzọ wee nyere aka gbarie nnukwu okwute tupu a dọpụta ozu ya bụ nwaokorobịa.
Onye isi ndị NEMA ngalaba nke Enugwu bụ Fred Aṅụsim kwuru na odoro anya na ọbụ ụlọ adigboroja ka onye nwe ya bụ ụlọ na arụ wee kwee nkwa na ndị ụlọ ọrụ ya ga-enyere aka nwude onye nwe ụlọ nakwa Engineer na-arụrụ ya ụlọ ka ha kọwaa ụzụ kuziere ha ịkpụ ogene.

Onye nnochite anya SEMA n'Enugwu bụ Nkechi Eneh Kwuru na ya ga-eme nchọpụta ihe mere ya bụ ụlọ ana-arụ arụ jiri daa.
Nchọpụta gosiri na ya bụ nwa okorobịa nwụrụ anwụ Chideraa Odo gbara afọ ihe dịka iri abụọ na otu, nna ya bụ onye uweojii lara ezumike nka, ebe ha bị na Police detective college Enugwu.
Ndị agbata obi ya na police barack kwuru na nwatakịrị ahụ na-agba mbọ nke ukwuu nke na ọ na aga eso arụ ụlọ were na enweta ego oji enyere onwe ya aka ma na akwadobe ide Jamb.

Nwa nne ya nwaanyị kwuru na Chideraa dịka olileanya ezinaụlọ ha were kwuo na ha dịzị ka ndị ọkụ ha nyụrụ n'ike. Anyị enweghị ike ịgba nne na nna ya ajụjụ ọnụ n'ihi na ibe akwa na iru uju karịrị ebe ahụ.
Mazị Tim Adibe bụ onye agbataobi ya ụlọ dara ada kpọkuru ministri gọmenti Enugwu steeti ọ dị na-aka ka ha na enyocha ụlọ ọbụla a na-arụ ọhụrụ iji mata ma ha esoro ihe iwu ịrụ ụlọ kwuru.
Adibe onye kwuru na ya bụ onye otu ndị Engineer kwuru na ọ bụ iji akụrụngwa adigboroja nakwa iji Engineer adịgboroja rụọ ụlọ na-ebute ụlọ ida ada ma dagbuo mmadụ.
Ihe ịgba anya mmiri mere n'Idaw River Enugwu ebe ụlọ a na-arụ arụ dagburu otu nwa nwoke na-enyere aka na ya bụ ọrụ.









