Nse Ikpe Etim: Ihe mere o ji wepụ akpa nwa ya

Ebe foto si, @Nseikpeetim
Gịnị mere ndị mmadụ ji anwụ ọgwụ n'elu isi na-awa ndị ọzọ?
Ọ bụ ajụjụ a mere onye ama ama na-eme ihe nkiri bụ Nse Ikpe Etim ka ọ kọwapụta etu ndị mmadụ si na-agbadoro ya ọkụ n'akpa nwa ya.
N'ime mkparịtaụka o nwere nso nso akpọrọ " conversations with Nse", ọ gwara ndị mmadụ na ụmụnwaanyị na-amutabeghị nwa na-agabiga ọtụtụ ihe n'aka ụwa.
Ọ sị "ọtụtụ na-eche na nwaanyị na-amụtaghị nwa abụghị nwaanyị."
"N'etiti ịdị ndụ na ịmụta nwa , a họrọla m ịdị ndụ ya mere m ji wepụ akpa nwa m na-enye m nsogbu"
"Ọtụtụ mmadụ na-eche na ọ bụ maka na m bụ onye na-agba n'iro mere m ji na-amụtaghị nwa." Ọ bụghị eziokwu.
Nse kwuru na ihe ndị a niile ndị mmadụ boro ya mere ka obi ya daa mba mana ugbua o fụkerela.
Ndụmọdụ ọ na-enye ụmụnwaanyị bụ ka ha hụ onwe ha n'anya ma mee ihe dịmma masịrị ha ghara ị na-ele ndị mmadụ anya n'ihu.









