Twin babies: Ndị chọrọ ịmụ ejima lee egbe anya n'ọdụ
Akụkọ ndị dị mkpa taa:
Akụkọ maka ejima

Ebe foto si, Chris Sanctus Okereke
Ndị be anyị o, onye chọkwara ịmụ ejima gawa Igbo Ora dị na Oyo steeti.
Nchọpụta ekwuola na ọ bụ n'ebe ahụ ka a kacha amụ ejima nke ndị ebe ahụ kwuru na ọ bụ ahihara ha na-eri kpatara ya.
Ndị ọkammụta kwukwara na ha ahụghị ihe jịkọrọ ya bụ akwụkwọ nri na ịmụ ejima.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Mkpọcha na Nzacha n'Ebonyi steeti

Ebe foto si, PDP/facebook
Ka anyị bido n'Ebonyi steeti ebe Gọvanọ Dave Umahi nọ n'ọrụ nzacha na mkpọpụ ndị ọ sị na aka ha dị na tigbuo zọgbuo dị na steeti ahụ.
Dịka Kenneth Ugbala bụ Kọmishona oke ala dị n'aka si kwuo, Umahi chụrụ onyeisi ọrụ nnyọcha akụ na ụba steetị ahụ bụ Innocent Nwida nakwa ndị isioche okpuru ọchịchị abụọ.

Ebe foto si, AFP/HO/SUDAN TV
Na Sudan onyeisi agha isiabaokpu weghara ọchịchị n'ike bụ Lt-Gen Abdel Fattah Abdelrahman eforola ntutu taa na ya ga-ekpochapu ihe gbasara ọchịchị nke ochie na mba ahụ.
Abdelrahman wepụrụ mmachị a machiri ngaghari, tọhapụ ndị na-eme ngaghariiwe a tụrụ dịka ndị mba ahụ kpọrọ ekwo nku na ọ ga-enyeghachi ndị nkiti ọchịchị ozugbo.

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuruegwu , onye nkụzị ndị otu egwu bọọlụ Super Eagles bụ Gernot Rohr ekwuola na ndị otu ya ga-akpachapụ anya n'izute ndị egwu bọọlụ Burundi nakwa Madagascar.
Rohr sị na ndị dị otu a nwekwara ike itinye aja na garị ebe ọ bụ nke mbụ ha na-apụta iso zọọ iko mba Africa .
Gee nkeji anyi
Rochas Okorocha asaala otu PDP n'ebubo izufu akụ Imo

Ebe foto si, Facebook/Emeka Ihedioha/Rochas Okorocha
Gọvanọ Imo steeti bụ Rochas Okorocha asaala otu PDP ọsịsa n' ebubo ha na-ebo na ọ na-ezufu akụ na ihe enwenwe nke steeti ahụ, dịka ụgbọ ya na-akụ kwarapụ kwarapụ.
Okorocha kwuru na ọ bụ PDP nwe aka enwe dị n'ofe n'okwu ahụ.
N'ozi ọnụ na-ekwuru ya bụ Sam Onwuemedo wepụtara ụbọchị Fraide, Okorocha boro PDP ebubo iji ike na-ezukọ ụgbọala , oche dị oke ọnụ ahịa, ọkụ nakwa ihe ndị e chiri chọọ steeti ahụ mma.
Zamfara: Ndị agha agọọla ebubo igbu ndị aka ha dị ọcha

Ebe foto si, Nigeria Air Force HQ/Facebook
Ndị agha ụgbọelu Naijiria na ndị eze na Zamfara steeti na-adọrịta ụka onye okwu ya kwụ ọtọ .
Ndị agha gwara ụmụ Naijiria na ha kposara ebe ndị omekome jiri mere isiụlọọrụ ha na steti ahụ ma gbuo ọtụtụ n'ime oge ha ji ụgbọelu lụọ ọgụ na steeti ahụ na nsonso.
Mana onyeisi ọgbakọ ndị eze na steeti ahụ bụ Emir nke Bungudu, Alhaji Hassan Attahiru, kwuru na ndị ihe metụtara bụ ndị mmadụ aka ha dị ọcha.
Mana ndịagha ụgbọelu asaala ebubo ahụ n'ozi ha wepụtara ma kwuo na ya mere nyocha ha nke ọma tupu ha wakpoo ebe ndị ha wakporo n'abalị asatọ rue iri na otu nke ọnwa Eprelụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ha gara n'ihu rịọ sị kama ị na-akọ akụkọ ajambele, " onye ọbụla nwere ihe aka ebe ịgosi na ọ bụ ndị nkịtị aka ha dị ọcha ka awakporo wepụta ya."
A gakwala Borno maka ndị ntọ- gọọmenti Amerịka
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Mba Amerịka amala ọkwa ọhụrụ ma dọọ ndị amaala ha aka na ntị ka ha kpachapụ anya ịbịa ala Naijiria iji gbalahụ ịdaba n'aka ndị ekperima maọbụ ndị na-eyi ndụ egwu nwere ike ịtọrọ ha,
mpụ ndị ọzọ dịka ohi, mwakpo nakwa ọgbaghara.
Naijiria so na mba iri atọ na ise Amerịka na-agwa ka ha mụrụ anya dịka azụ n'ihe gbara ị ga njem ebe ahụ.
Anyị ga achọ ndị egwu a pịrị aka-Solskjaer

Ebe foto si, Getty Images
Onye nchịkọta otu Manchester United bụ Ole Gunnar Solskjaer ekwuola na ihe chere ha aka mgba n' asọmpị ndị na-abịa bụ ọkpọka. Mana Mana anụ gba ajọ ọsọ, a gba ya ajọ egbe dịka o kwuru na ọ bụ ndị egwu ha pịrị aka ga-ewelite otu egwu bọọlụ ha elu ga-esonye ha na ya bụ ije.
































