Sex strike: 'Ụmụnwaanyị gbaanụ abụbụ mmekọ ahụ nwoke ọbụla maka iwu ike ime' - Alyssa Milano

Ebe foto si, AFP/Getty images
Onye na-eme ihe nkiri ama ama dịka Alyssa Milano arịọla ụmụnwaaanyị ka ha gba abụbụ mmekọ ahụ ha na nwoke.
Ọ gwara ha mee nke a iji gosi iwe ha gbasara iwu ọhụrụ e wepụtara na steeti Georgia dị na mba US.
Iwu ahụ na-emegide nwaanyị ikekpa ime.
Nke a mere #Sexstrike ji ewu n'elu soshal midia.
N'akụkọ ọzọ,

Ebe foto si, PHILIP OJISUA
Aka chiburu Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan ekwuola na onweghị ụlọ, ọbaego maọbụ azụmahịa o nwere na mba ofesi.
Ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Ikechukwu Eze depụtara nke a n'akwụkwọ ozi n'iji saghachị akụkọ pụtara na ọkaịwu gọọmenti etiti tinyere aha ya n'ikpe dị n'ụlọikpe dị na London maka ebubo ịna aka azụ
azụmahịa mmanụ na-akwụghị ọtọ.
Achụpụla Boko Haram n'obodo anọ na Borno

Ebe foto si, Getty Images
Ndị agha Naịjirịa egbuola ndị omekatara pụọ ụjọ n'anya akpọrọ Boko Haram anọ dịka ha na-eme atụmaatụ "Ọnyịrị ọnwụ" .
Ọnụ na-ekwuchitere ndị agha Naịjirịa bụ Sagir Musa kwukwara na ha hazigharịala obodo
Surdewalla, Ranwa, Baladayo, Sabon Gari na Shetimeri ebe ndị omekoome a na-akpa mkpa mkpa di egwu.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Manchester city emeriela English Premier League nke izu 2018/2019 dịka ha merichara Brighton ọkpụ anọ asatara otu.
City gbagoro n'ogo nke mbụ tebulu Premier League dịka ha ji otu pointi gafee Liverpool n'ọzị n'ogo abụọ.











