Valentine's Day: Etu ị ga-esi gosi ịhụnanya na-emefughi oke ego

- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Ị ma na ị nwere ike igosi ịhụnanya na-emefughi oke ego?
Ọtụtụ oge ka ndị mmadụ na-ebido n'oge na-atụkọta ego ha ga-eji kpọrọ onye ha hụrụ n'anya gaa gosi ha ịhụnanya ha.
Mana ihe ụfọdụ n'ime ha na-achọpụtabeghi bụ na ị nwere ike igosi ịhụnanya n'ụzọ na-agaghị efu gị oke ego.
Ọbụghị naanị isusu onye ị hụrụ n'anya ọnụ ka ị ga-emenwu na-atụfughi ego, e nwere ihe ndị ọzọ dịkwa mkpa.
Ka anyị kọwaara gị:
- Mmanya na ihe ntagharị ọnụ: Ị ma na ị jiri aka gị gaa zụta ihe ndị a n'ahịa, na ọ ga-aka adị ọnụ ala karịa mgbe ị zụrụ ya n'ụlọ oriri na nkwari?
Ebe ị nwere ike ịzụta otu karama mmanya n'ọnụ narị (N100) n'ahịa, ndị na-ere ya n'ụlọ oriri na nkwari na-ere ya ihe ruru bido na narị ise gbagowe.

Ebe foto si, Slippery Lounge
Ị nwekwara ike ịzụta mkpụrụosisi na ihe ndị ọzọ e ji eme mmanya, jiri aka gị meta mmanya nke gị.
- Nzipu ozi ịhụnanya: Nke a nwere ike ịbịa site n'ide ozi ịhụnanya n'elu ekwentị; bụ nke bekee kpọrọ "text message".
Ị nwekwara ike ide ozi ịhụnanya n'elu akwụkwọ; bụ ihe bekee kpọrọ "letter", maọbụ ị dee ya n'elu soshal midia.

Ebe foto si, Getty Images
- Nri: Dịka ịzụ mmanya n'ụlọ oriri na nkwari, ọ na-aka ada ọnụ ịzụ nri n'ezi; ọkachasị ụbọchị dị etu a ndị mmadụ na-eju n'ụdịrị ebe a.
Ike adị gị ịkwụ n'ahịrị naanị ka ị nwee ohere ịzụta nri na-agalakwa ọnụ n'elu ya?

Ị nwere ike ịgbanarị mmekpahụ ahụ ma menyekwa "ịhụnanya gị" obi aṅụrị site n'isi nri a kwọrọ aka sie karịa ịga zụọ nri n'ezi.
- Akwụkwọ ịhụnanya: Ị ma na ịgwa onye ị hụrụ n'anya na ị hụrụ ya n'anya ga-eme ya obi ọma?
Etu ọzọ ị ga-esinwu gwa ya na-abụghị naanị ịgwa ya ihu n'ihu bụ iwere obere akwụkwọ na-amado amado nke bekee kpọrọ "sticky notes" wee detuo ebumnobi gị.

Ị nwere ike ide "Ahụrụ m gị n'anya" madochaa ya n'akụkụ ụlọ ebe ị chọrọ ka ọ hụ ya.
Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri a ga-amasị gị:









