Building collapse in Lagos: Gọọmenti amalịtela ịkpụda ụlọ ndị a gbajọrọ

Onye ọrụ gọọmenti ka ọ na-akpụda ụlọ ndị a gbajọrọ
Nkọwa foto, Ndị ọrụ gọọmenti amalịtela ịkpụda ụlọ ndị a gbajọrọ
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Gọọmenti Legọs steeti ebidola ịkpụta ụlọ ndị e kwuru na ha adịghị etu o kwesịrị na Ita Faaji dị na Lagos Island dị na Legọs.

Onye ọrụ gọọmenti ka ọ na-akpụda ụlọ ndị a gbajọrọ
Nkọwa foto, Ndị ọrụ gọọmenti amalịtela ịkpụda ụlọ ndị a gbajọrọ

Ndị ọrụ gọọmenti ji mkporo igwe na-ịkụtusi ụlọ ndị a gbajọrọ kemgbe ihe karịrị otu afọ gara aga.

Ụlọ ndí gọọmenti Legós gbajọrọ

Nke a na-eme na dịka mmadụ 11 nwụrụ n' n'ihe mberede ụlọelu dara na Legos.

Ihe ruru mmadụ iri ise bụ ndị a zọpụtara, gụnyere ụmụakwụkwọ n'ime ụlọ ahụ bụ ụlọakwụkwọ Pramarị ma bụrụkwa ebe obibi.

Ụmụaka merụrụ ahụ
Nkọwa foto, Ụmụakwụkwọ Ohen Nursery & Primary School so na ndị azọpụtara n'ebe ụlọelu dara na Legọs

Ndị ọrụ gbagbata kwụsịburu ọrụ ịchọ ndị ụlọ dagidere ụbọchị Tọọzde.

O nweghị onye ma mmadụ ole nọ n'ụlọ ahụ oge ọ dara mana obi adịghị ọtụtụ ndị mmadụ mma dịka gọọmenti kpebiri ịkwụsị ịchọ mmadụ ebe ahụ n'ihi na ọtụtụ ahụbeghị ndị nke ha.

N'oge ọ na-agwa ndị ntakụkọ okwu n'ụtụtụ Tọọzde, Adesina Tiamiyu bụ onyeisi ngalaba gbatagbata nke Legos steeti nke a kpọrọ Lasema n'aha ịchafụ dụburu ndị nne na nna na-achọ nwa ha ọdụ ka ha ga n'ụlọọgwụ Island General Hospital iji nweta ozi maka onye ha na-achọ.

Adesina Tiamiyu
Nkọwa foto, Adesina Tiamiyu bụ onyeisi Lasema kkwuru na a gụkọcha beghị mmadụ ole nwụrụ n'ọdachi ụlọelu dara na Legọs ụbọchị Wenezde

O kwuru na akụkọ na ụlọakwụkwọ ahụ o metụtara nwere ụmụaka ụmụakwụkwọ otu narị bụ ụgha.

Ụlọelu nwere ụlọakwụkwọ dara n' Ita Faaji dị na Lagos Island digbuo ọtụtụ mmadụ gụnyere ụmụaka ma merụkwa ụfọdụ ahụ n'ọdachi ahụ.

Ndị nne na nna jupụtata n'ụlọọgwu

Ebe ụlọ dara na Legọs

Ndị nne na nna wakporo ụlọọgwụ 'General Hospital, Marina, na legọs na ụlọọgwụ ndị ọzọ dị nso ịchọ ndị nke ha dịka akụkọ na o nwere ndị azọpụtaran'ụlọ dara na Legọs ụbọchị Wenezde.

Oge BBC gara n'ụlọọgwụ ahụ, ọtụtụ ndị o metụtara jupụtara ma na-anata nleta n'ọnụmara dị iche iche dị n'ụlọgwụ ahụ.

Onye nnukwu odeakwụkwọ Mịnịstry na-ahụ maka ahụike gwara Grace Ekpu nke BBC na a na-elezi ndị ahụ ka azọta ha ndụ tupu eziga ha n'ụlọgwụ ndị ọzọ.

Ụlọelu nwere ụlọakwụkwọ dara n' Ita Faaji dị na Lagos Island digbuo ọtụtụ mmadụ gụnyere ụmụaka ma merụkwa ụfọdụ ahụ n'ọdachi ahụ.

Onyeisiala Muhammadu Buhari ezigarala ndị ọdachi ụlọelu dara n'Ịta-Faajị metụtara okwu nkasiobi.

N'akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuchitere ya bụ Femi Adesina kesara, o kwuru sị na ọ na-ewute ya nke ukwuu na ihe a metụtara ọkachasị ụmụaka.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

O kwuru sị na ọ na-ekpe ekpere ka Chineke gbaa ezinaụlọ ha ume, ma na-ekpe ekpere na ndị merụrụ ahụ ga-agbake n'oge na-adịghị anya.

O kwekwara gọọmentị Legọs nkwa na gọọmentị etiti ga-enyere ha aka n'ụzọ ọbụla ha chọrọ.

Buhari kwuru sị "Ọ na-emetụta mmdụ ma mmadụ nwụọ n'ọdachi ọbụla, ọkachasị mgbe ọ bụ ndị ka bụ ụmụaka. Ka Chineke gbaa onye ọbụla ihe a metụtara ume."

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Onye isi ndi ọrụ gbatagbata ebe ụlọelu a dara ada n'Ita Faaji na Legos sị na ụlọ ahụ nwere ogogo atọ.

Enyemaka ndị mmadụ ebe ụlọ elu nwere ogogo atọ dakwasara ụmụụlọ akwụkwọ na Legọs

Mpaghara nke mbụ bụ ebe ndị na-ere ahịa nọ.

Mpaghara nke abụọ bụ ebe ndị mmadụ bi, ebe mpaghara nke atọ bụ ebe ụmụakwụkwọ karịrị narị na ndị nkuzi ha nọ.

Ndị gbatagbata ebe ha na-azọ ndị merụrụ ahụ n'ụlọ dara na Legọs

Ndị ọrụ gbatagbata azọpụtala ihe karịrị ụmụaka anọ so na ndị tọrọ n'okpuru ụlọelu atọ dara na Legọs ebe mmadụ itoolu nwụrụ.

Eserese ebe ụlọelu dakwasara ndị mmadụ na Legọs

Aka na-achịkọta Legọs bụ Akinwunmi Ambode gara ebe ahụ iji kasie ndị mmadụ obi, mana ndị mmadụ tụgharịrị na-atụ ya akpa mmiri.

O kwuru okwu nkasiobi n'elu Twitter

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Ụlọ dara na Legọs

Anyị nụkwara na eburula ụfọdụ ndị azọpụtara gawa ụlọọgwụ Island Maternity dị nso n'ebe ahụ.

Ndị gbatagbata na-azọ ndị merụrụ ahụ ebe ụlọ dara na Legọs

Onye ntaakụkọ BBC nọ n'ebe ihe mere na-ekwu na aha ụlọakwụkọ ahụ bụ 'Bardem' nke dị na Legọs Island.

Onyeisi ndị gbatagbata e kwoula na ụmụakwụkwọ karịrị narị juru n'ime ụlọ ahụ tinyekwuru nwaanyị dị ime nakwa ndị nkuzi ha sochakwa na ndị tọrọ n'ime ụlọ ahụ.

Ndị ọrụ nchekwa dị icheiche nọ ebe ahụ soro na-enye ndị ọrụ gbatagbata enyemaka.

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Ndị ọrụ gbatagbata kwaturu ụlọ ndị dị nso n'ebe ahụ iji chọta ohere ebe a ga-esi zọpụta ndị tọrọ ebe ahụ.

Ndị gbatagbata ka ha na-achọ ndị tọrọ n'ụlọ elu dara na Legọs

Ihe mberede a mere n'ụtụtụ ụbọchị Wenzde ka anyị nụrụ maka ihe mberede na ụlọ obibi nakwa ụlọakwụkwọ so n'ime ụlọ a dara na Legọs.

Akụkọ kwukara na ụfọdụ ụmụaka ka tọrọ n'okpuru ya bụ ụlọ ebe ndịọrụ gbatagbata na-agbalị ịzọpụta ha.

Ndị gbatagbata na-azọ ndị merụrụ ahụ ebe ụlọ dara na Legọs

BBC Igbo ghọtara na o ruola afọ abụọ kemgbe gọọmentị na-achọ ịkwatu ụlọ a mana onye nwe ya ekweghi.

Enyemaka ndị mmadụ ebe ụlọ elu nwere ogogo atọ dakwasara ụmụụlọ akwụkwọ na Legọs

Akụkọ ga-amasị gị ịkọ