Onitsha Tanker Accident : 'Ọtụtụ mmadụ anwụọla tupu ebute ha n'ụlọọgwụ anyị' - Dọkinta
Clement Jackson so na otu onye dị ndụ ka ụgbọala "tanker" kwọgbuchara ọtụtụ mmadụ n'Onitsha.
O kwuru na ka ọ mapụchara na 'Keke' bu ya, ụgbọala tanker ahụ kwọgbuo ndị ya na ya so.
Kirie ka ịhụ ka ndị ọzọ dị ndụ si zere ọnwụ n'ihe mberede a.