Priscilla Ekwueme Eleje: Onye bụ nwaanyị a na-akpa ike?

Mbinyeaka Ekwueme Eleje ebe ó na-egosi
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Priscilla Ekwueme Eleje bụ nwaanyị mbụ mbinyeaka ya na-apụta n'ego Naịjirịa nke otu puku, n'ime afọ iri isii na otu.

Ọ bụkwa nwaanyị nke mbụ ga-anọ n'ọkwa "Director of Currency Operations" n'ụlọakụ etiti na Naịjirịa.

Ihe abụọ ndị a bụ ihe mere o ji ewu ewu ebe niile na Naịjiria gụnyere soshal midia.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Lee ihe ndị anyị chọpụtara maka ya.

Naira

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, EFCC kwuru na Umar chọ nde naira ịrị

Ọ bụ onyeisi na-ahụ maka ngagharị ego na Central Bank bụ ụlọakụ etiti Naịjirịa.

  • Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum nke Jos dị na Plateau steeti n'afọ 1981 na afọ 1984.
  • O bidoro ọrụ n'ụlọakụ etiti n'afọ 1984 rue afọ 2010 mgbe ọkwa ya rịrị elu.
  • Ọ gụkwara akwụkwọ na mahadum Boston dị na Massachusetts dị na mba Amerịka.

Priscillia ga-esonye Ngozi Okonjo Iweala na Sandie Okoro bụ ụmụnwaanyị Naịjirịa abụọ nwere ọkwa n'ụlọakụ ukwu nke ụwa niile.

Anyị ga-ewetakwa ihe ndị a na-amaghị maka Odoziakụ Priscillia Ekwueme Eleje.

Akụkọ ga-amasị gị