Rudeboy Reason with me: "Ọ bụghị iwu na ị ga-alụ nwaanyị ọbụla mụtara gị nwa"
Paul Okoye kọwara ihe ọ hụrụ n'aka ụmụnwaanyị n'ime egwu ọhụrụ o tiri bụ 'Reason with me'.
Ọ kwuru na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere na ụmụ nwaanyị dị icheiche na-apụta agwa ya na ọ tụwara ha ime.
Gee ihe o kwuru n'uju ebe a.
Dịka okwu a na-ewu na soshal midia, lee ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya ebe a:
Olisa kwuru na ọ kọwara akụkọ ndụ mmadu n'ime egwu ahụ
Starvy na-agwa asa ya nya biko nye ha ohere gee ya ntị
Ebe Taiwo na-ekwu na ọ bụrụ na ya na ejima abịaghị na ọ gaghị ege egwu ya ntị

