Chizoba Rudeboy: Ihe mere m ji gụọ egwu a - Paul Okoye
"Chizoba, Chizoba, Chizobaaaa" Paul Okoye - bụ onye eji Rudeboy mara - si etu a kwe ukwe egwu ọhụrụ ya.
Maazi Okoye bụbụ onye nke abuọ n'ime PSquare, bụ aha otu egwu ya na ejima ha hibere.
Egwu ọhụrụ ya na-ewu ugbua na soshal media na ndị mmadụ na-eche ihe mere oji na-arịọ chukwu ka udo laghachị azụ n'ime ya bụ egwu.
Egwu a pụtara n'elu soshal media ụnyaahụ bụ Nọvemba 19.
Ka egwu a pụtara, ndị mmadụ bidoro na-ekwu na ọ bụ maka esemokwu dị n'etiti Maazi Okoye na ejima ya ka ọ ji agu egwu.
@OnyecheE rịorịọ Maazi Okoye n'akara Twitter na oge eruola ejima a ga-anabata onwe ha n'udo.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Mana n'uche @ItzArinze oge eruola Paul chefuru ihe niile gbasara ya na PSquare.
O kwuru na ihe kachasị mkpa ugbua bụ ka egwu ya n'eto ebe ọbụla.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
BBC gbara mbọ ịga nụta n'ọnụ onye ji mma na ji na akuko a bụ Paul Okoye, maka okwu na-aka mma n'ọnụ onye nwe ya.
Maazi kwuru na akụkọ ọbụla di n'okwu a kwesiri ịtụgolo n'elu na ya bụ onye, nke pụtara na ya nwereike ịti egwu maka ihe ọbụla.
Ọ gakwara n'ihu kwuo na ya gụrụ egwu a kemgbe otu afọ gara aga, mana ọ bụ ugbua ka o weputara ya.
Maazi Okoye kwusiri ike na ọgaghị ekwe ka ihe ndị mmadụ na-eche maka ya maọbụ ezinaụlọ ya mee ya kwụsị ịbụ egwu ọbụla batara ya n'obi.
Okoye sị kwuru: "A bụ m onye egwu, e tiri m egwu a makana a chọrụ m ịkpalite mmụ ndị mmadụ ọbụghị maka ihe ọzọ ndị mmadụ na-eche".
Ọ gakwara n'ihu si ka onye ọbụla nwere egwu kesaa ndi ezinaụlọ maka ezigbote ozi dị n'ime ya.
Akụkọ ga-amasị gị










