Afrima: Lee ndị otiegwu Naijiria chawara na nturuugo Afrika

Ebe foto si, Peter Okoye/Getty Images
Ụmụ Naijiria na-eti egwu gụnyere David Adeleke a mara dịka 'Davido' wara dịka ọnwa na nturugo Afrima nke mere na Ghana.
Davido nwetara nzere okaibe otiegwu nke afọ a nke a kpọrọ 'Artist of the Year' na mmemme nturuugo ahụ.
Peter Okoye, otu n'ime ejima PSquare nwetara nzere 'Best 'Choregrapher of the year'
Ebe Folarin Falana a ma dịka 'Falz' nwetara nturuugo 'Best rapper.'
Innocent Idibia a mara dịka 'Tuface' nwetara nturuugo 'Best African pop.'
Praiz ritere 'Best Artiste inn African R 'N' B.'
N'aka nke ọzọ, ọgụegwu a ma n'Afrịka bụ Yvonne Chaka Chaka, nwetara nzere, "Legendary Award, ebe Sarkodie nke Ghana nwetara ' Best Male artiste in African Inspirational music).'
Ndị otiegwu si mba dị iche iche n' Afrịka gbakọrọ na Ghana n'ụbọchị Satode maka mmemme Afrima bụ nturuugo na- akwanyere ndị otiegwu si Afrika ezi ugwu maka aka ọrụ ha.
Akụkọ ga-amasị gị:








