Akụkọ ndị dị mkpa taa: 'Ndị Abịa chekwaanụ vootu ụnụ'
Akụkọ dị mkpa taa bụ ụka:
Alex Otti sị ndị Abịa chekwa vootu ha

Onye na-azọ ọkwa gọvanọ Abịa steeti n'aha ndị otu APGA bụ Alex Otti ekwela ndị Abia nkwa na ya ga-agba mbọ ịhụ na a naghị ya mmeri ndị na-akwado ga-enye ya na ntuliaka na-abịa na 2019 ma rịọ ndị Abia ka ha chekwaba vootu ha.
Otti kwuru nke a n'ọgbakọ obodo nke ndị APGA nwere na Legos, ụbọchị Satọde.
Mmadụ itoolu na-arịa ịba-uhie

Ebe foto si, NCDC
Ngalaba na-ahụ maka mgbochi ọrịa na Naijiria a kpọrọ "Nigeria Centre for Disease Control(NCDC) " ekwuola n'ezie na ịba-ụhie ejidela mmadụ itolu n'Edo steeti.
NCDC kwuru na e zigala WHO ọbara ndị ahụ ịba ahụ a maghị ihe butere ya si n'okpuru ọchịchị anọ n'Edo maka ịganihu na nyocha ahụ.
Ịbịa-uhie nke a kpọrọ 'yellow-fever' na bekee bụ ọrịa na-agbasa ma anwụnta bu ya taa mmadụ.
Otu Igbo chọrọ ka gọọmenti kpopụ ndịagha n'ala Igbo

Ebe foto si, Getty Images
Otu World Igbo Congress akpoola gọọmenti Naijiria oku ka ha kpọbu ndị agha Naijiria ha kpojuru n'ọwụwa anyanwụ Naijiria, ma tinye uchu n' Ugwu Awụsa ebe ndị Boko Haram na-akpa ike gburu ọtụtụ ndị agha na nso nsọ a.
Buhari egosila obi mgbawa

Ebe foto si, Getty Images
Ka abali isii ọdachi a mechara, Onyeisiala Naijiria bụ Muhammdau Buhari ekwupụtala obimgbawa maka ndị agha Naijiria e gburu ụbọchị ụka gara aga.
Ndị omekataraihe daaụjọ Boko Haram na ogbo ha IS nke ọdịda anyanwụ Afrika gburu ihe karịrị ndị agha Naijiria iri anọ na Metele dị na Borno steeti ụbọchị ụka gara aga.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, @NGSuper_Falcons
Mịnịsta na-ahụ maka ndị ntorobịa na egwurekwu bụ Solomon Dalung etoola otu Super Falcon maka inweterela Naijiria ọnọdụ isonye n' ọkara ikpeazụ nke asọmpi iko Afrika nke ụmụnwaanyị ga-agba na mba Ghana.
Ndị Falcon jiri okpu isii gosi ndị ndị Equatorial Guinea nkarị n' asompi ha nwere na Cape Coast ụbọchị Satọde.








